Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Job 12:22 - Bible Nso

22 Ọ nēsi n'ọchichiri kpughepu ihe di omimi, We me ka onyinyo ọnwu puta ìhè.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

22 Ọ na-ekpughe ihe omimi nke ọchịchịrị meekwa ka oke ọchịchịrị pụta ìhè.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Job 12:22
15 Iomraidhean Croise  

Otù onye nime ndi-orù-ya we si, É-è, onye-nwem eze: kama Elaisha, bú onye-amuma nke nọ n'Israel, o nēgosi eze Israel okwu nile nke i nēkwu n'ime-ulo-ndina-gi.


Gosi gi ihe-nzuzo nile nke amam-ihe, Na ọ di okpukpu n'izube ihe. Gi mara kwa na Chineke nēme ka echezọrọ gi ufọdu nime ajọ omume-gi.


N'ihi na ututu buru usu ha nile onyinyo ọnwu; N'ihi na ọ nāmata ihe-egwu nile nke onyinyo ọnwu.


Ka ọchichiri na onyinyo ọnwu b͕aputa ya; Ka igwe-oji biri n'elu ya; Ka ihe nile nke nēme ka ubọchi b͕a ọchichiri me ka ọ tua egwu nke-uku.


Ọ dighi ọchichiri di, ọ dighi kwa onyinyo ọnwu di, Ebe ndi nālu ajọ ihe gēzo onwe-ha.


M'we si, N'ezie, ọchichiri gēkpuchim; Ma abali ghọrọ ìhè buruburum.


Ọbuná ọchichiri adighi-ab͕achiri Gi; Ma abali nēnye ìhè dika ehihie: Dika ọchichiri si di, otú a ka ìhè di n'anya-Gi


Chìneke agaghi-egwuputa ala ihe a? N'ihi na Ya onwe-ya mara ihe-nzuzo nile nke obi.


Ya onwe-ya nēkpughe ihe nile di omimi di kwa nzuzo: Ọ mawo ihe di n'ọchichiri, ìhè nēbi kwa n'ebe Ọ nọ.


chọnu Onye nēme Pleiades na Orion, Nke nāb͕anwe onyinyo ọnwu ka ọ ghọ ututu, Nke nēme kwa ka ehihie b͕a ọchichiri dika abali; Onye ahu Nke nākpọ miri nke oké osimiri òkù, we wusa ha ala; Jehova bu aha-Ya;


Ya mere, unu atula egwu ha: n'ihi na ọ dighi ihe ọ bula ekpuchiworo ekpuchi, nke anāgaghi-ekpughe; ọ dighi kwa ihe ezoro ezo, nke anāgaghi-ama.


Imukwasi ndi nọ n'ọchichiri na onyinyo ọnwu ìhè; Iduzi ukwu-ayi ba n'uzo udo.


Ma ọ bu ayi onwe-ayi ka Chineke kpughere ha site n'aka Mọ Nsọ: n'ihi na Mọ Nsọ nēnyocha ihe nile, ọbuná ihe nile di omimi nke Chineke.


Ya mere, unu ekpela ihe ọ bula ikpé mb͕e oge ahu akērughi, rue mb͕e ọ bula Onye-nwe-ayi gābia, Onye gēweputa kwa ihe nile ezoro ezo nke ọchichiri n'ìhè, me kwa ka ìzù nile nke obi nile puta ìhè; mb͕e ahu ka madu nile n'otù n'otù gēnwe kwa otuto-ha site n'aka Chineke.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan