N'ezie ahuwom ọbara Nebot na ọbara umu-ya ndikom n'abali hnyahuru, ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta; M'gākwughachi kwa gi n'òkè-ala-ubi nka, ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta. Ma ub͕u a bulie ya, tubà ya n'òkè-ala-ubi ahu, dika okwu Jehova si di.
M'gēyikwasi ya uwe-gi, were ihe ahu anēke gi n'úkwù kesie ya ike, ọ bu kwa ọchichi-gi ka M'gēnye ya n'aka: ọ gāghọ-kwa-ra ndi bi na Jerusalem na ndi ulo Juda nna.
O rue, mb͕e ya onwe-ya nākpọ isi ala n'ulo Nisrok, bú chi-ya, na Adramelek na Shareza, bú umu-ya ndikom, were mma-agha tib͕ue ya: ma ndi ahu wepugara onwe-ha la n'ala Ararat. Isa-hadon, bú nwa-ya, we buru eze n'ọnọdu ya.
Otú a ka Jehova siri onye-Ya etere manu, bú Sairọs, onye M'jideworo aka-nri-ya, izọda mba di iche iche n'iru ya, ọ bu kwa úkwù ndi-eze ka M'gēkepu; imeghe uzọ n'iru ya, agaghi-emechibido kwa ọnu-uzọ-ama;
ọ dighi onye nāda #mbà, ọ dighi kwa onye nāsu ngọngọ, n'etiti mba ahu; ọ dighi onye nātu òrù-ura, ọ dighi kwa onye nāraru ura; agaghi-atọpu kwa ihe-ọkiké úkwù-ha, agaghi-etibi kwa eriri akpukpọ-ukwu-ha abua: