Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Job 12:17 - Bible Nso

17 Ọ nēme ka ndi nādu ọdu la dika onye akwatara ihe-ya n'agha, Ọ nēme kwa ndi-ikpe ka ha ghọ ndi-nzuzu.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

17 Ọ na-anapụ ndị ndụmọdụ ọkwa ha chụpụ ha, ma ndị ikpe ka ọ na-eme ka ha ghọọ ndị nzuzu.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Job 12:17
10 Iomraidhean Croise  

Otú onye we gosi Devid, si, Ahitofel di n'etiti ndi-nkekọta ahu ndi nēso Absalom. Devid we si, Biko, Jehova, me ka idu-ọdu Ahitofel ghọ ihe-nzuzu.


Absalom na ndikom nile nke Israel we si, Idu-ọdu Hushai, bú onye-Akait, di nma kari idu-ọdu Ahitofel, Ma Jehova nyere iwu imebi ezi idu-ọdu nke Ahitofel, ka Jehova we me ka ihe ọjọ biakwasi Absalom.


Ma Ahitofel huru na emeghi ihe ọ duru n'ọdu, o we jikwa inyinya-ibu-ya, bilie, la n'ulo-ya, rue obodo-ya, o we nye ulo-ya iwu, kwub͕u onwe-ya: o we nwua, elíe ya n'ílì nna-ya.


O yipuwo nsọpurum n'arum dika uwe, We wezuga okpu-eze n'isim.


Mu na ndi-eze na ndi-ndum-ọdu nke uwa, Ndi nēwuru onwe-ha nkpọnkpọ ebe;


Enyewo uwa n'aka onye-nmehie: Ọ nēkpuchi iru ndi-ikpe-ya; Ọ buru na ọ bughi Ya, ònye kwa ka ọ bu?


n'ihi nka, le, M'gaje ilu kwa oké ọlu ọzọ n'etiti ndi nka, bú oké ọlu na ọlu ebube: amam-ihe nke ndi-ha mara ihe gāla kwa n'iyì, nghọta nke ndi-nghọta-ha gēzobe kwa onwe-ya.


O we me ka Okwu-Ya nile guzosie ike, bú nke O kwuru megide ayi, megide kwa ndi-ikpe-ayi ndi kpere ayi ikpe, n'ime ka ihe ọjọ uku biakwasi ayi: n'ihi na emeghi n'okpuru elu-igwe nile otú emeworo na Jerusalem.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan