Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Job 12:16 - Bible Nso

16 N'aka-Ya ka ike na nzube-ihe di; O nwere onye nēmehie n'amaghi-ama na onye nēme ka madu mehie n'amaghi-ama.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

16 Nʼaka ya ka ike na nzube ihe dị; ndị a ghọgburu na ndị na-aghọgbu bụkwa nke ya.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Job 12:16
10 Iomraidhean Croise  

N'aka-Ya ka amam-ihe na idi-ike di; Ọ nwere ndum-ọdu na nghọta.


Ọ̀ bu Chineke ka unu gēkwuru okwu ajọ omume? Ọ̀ bu Ya ka unu gēkwu-kwa-ra okwu aghughọ?


Ọ̀ di nma ka O gwuputa ala unu? Ma-ọbu dika madu si akwa madu emò, ọ̀ bu otú a ka unu gākwa Ya emò?


N'ezie mọ di nime madu, Iku-ume nke Onye puru ime ihe nile nēme kwa ka ha ghọta ihe.


N'ihi na Jehova nēnye amam-ihe; N'ọnu-Ya ka ihe-ọmuma na nghọta si aputa:


Ma Ya onwe-ya ma-kwa-ra ihe, we me ka ihe ọjọ bia, O wezugakwaghi okwu-Ya nile: ma O biliwo imegide ulo ndi nēme ihe ọjọ na imegide iye-aka nke ndi nālu ajọ ihe.


Ma onye-amuma ahu, mb͕e agārafu ya, o we kwue okwu, Mu onwem, bú Jehova, arafuwo onye-amuma ahu, M'gēsetipu kwa akam n'aru ya, kpochapu ya n'etiti ndim, bú Israel.


Daniel zara, si, Ka aha nke Chineke buru ihe agọziri agọzi site na mb͕e ebighi-ebi we rue mb͕e ebighi-ebi: n'ihi na amam-ihe na idi-ike, nke Ya ka ha bu:


Ewebàla ayi nime ọnwunwa, kama dọputa ayi n'aka ajọ onye ahu.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan