Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Job 11:6 - Bible Nso

6 Gosi gi ihe-nzuzo nile nke amam-ihe, Na ọ di okpukpu n'izube ihe. Gi mara kwa na Chineke nēme ka echezọrọ gi ufọdu nime ajọ omume-gi.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

6 Kpugheere gị ihe nzuzo niile nke amamihe, nʼihi na ezi amamihe nwere akụkụ abụọ. Mara nke a: Chineke echefuola ụfọdụ mmehie gị.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Job 11:6
21 Iomraidhean Croise  

Ma mb͕e ihe nile a gasiri, nke nābiakwasi ayi n'ihi omume ọjọ nile ayi, na n'ihi ikpe-ọmuma uku ayi, n'ihi na Gi onwe-gi, bú Chineke-ayi, eb͕ochiwo ahuhu-nmehie-ayi, ka ọ ghara idi elu ka ajọ omume-ayi, I we nye ndi-nb͕apu di otú a,


Ma otú ọ di, ọ gādim nọ̄ nma ma asi na Chineke ekwue okwu, Saghe eb͕ub͕ere-ọnu-Ya megide gi;


N'aka-Ya ka amam-ihe na idi-ike di; Ọ nwere ndum-ọdu na nghọta.


Ǹkasi-obi Chineke adikara gi ntà, Ha na okwu nke nēmeso gi nwayọ?


N'ihi na ajọ omume-gi nēzi ọnu-gi ihe, I nārọputa kwa ire ndi-aghughọ.


Ọ̀ bu ìzù nzuzo Chineke ka i nēge nti? Ì nēbilata-kwa-ra onwe-gi amam-ihe?


Ìhe ọjọ gi abaghi uba? Ọ dighi kwa nsọtu diri ajọ omume-gi.


O we si madu, Le, egwu Onye-nwe-ayi, nke ahu bu amam-ihe; Ọzọ, isi n'ihe ọjọ puta bu nghọta.


Le, ọ bu na nka ka i nābughi onye ezi omume; m'gāza gi: N'ihi na Chineke di uku kari madu.


O nwere obi nke mara ihe, Ọ nāb͕a kwa ume n'ike: Ònye mere onwe-ya ka o sie ike imegide Ya, we nọ n'udo?


Ọ bughi dika nmehie nile ayi si di ka O meworo ayi, Ọ bughi kwa dika ajọ omume nile ayi si di ka O mesoworo ayi.


Ìzù nzuzo Jehova diri ndi nātu egwu Ya; Ya na ọb͕ub͕a-ndu-Ya, ime ka ha mara ihe.


O sitere n'ebere nile nke Jehova na emeghi ka ayi gwusia, n'ihi na obi-ebere-Ya nile agwughi.


ma Chineke di, Onye nọ n'elu-igwe, Nke nēkpughe ihe-nzuzo nile, O mewo kwa ka eze, bú Nebukadneza, mara ihe aghaghi idi n'ikpe-azu ubọchi ndia. Nrọ-gi, na ọhù nile nke isi-gi n'elu ihe-ndina-gi, nka ka ọ bu:


Eze zara Daniel, si, N'ezi-okwu Chineke-unu bu Chineke nke chi nile, na Onye-nwe ndi-eze, na Onye nēkpughe ihe-nzuzo nile, ebe i puru ikpughe ihe-nzuzo a.


ka okwu ekwuru site n'ọnu onye-amuma we mezu, si, M'gāsaghe ọnum n'itu ilu; M'gēkwuwa ihe ezoworo ezo site na ntọ-ala uwa.


nke anēmeghi ka umu madu mara ya n'ọb͕ọ ọzọ, dika ekpughere ya ub͕u a nye ndi-ozi-Ya na ndi-amuma-Ya di nsọ nime Mọ Nsọ;


Ihe nile ezoro ezo diri Jehova, bú Chineke-ayi: ma ihe nile ekpughere ekpughe diri ayi, di-kwa-ra umu-ayi rue mb͕e ebighi-ebi, ka ayi we me okwu nile nke iwu a.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan