Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Job 11:19 - Bible Nso

19 Ọzọ kwa, i gāmakpu, ọ dighi kwa onye nēme ka i ma jijiji; Ọtutu madu gēme kwa ka iru-gi dajua.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

19 Ị ga-edina ala na-atụghị egwu onye ọbụla, ọtụtụ ndị mmadụ ga-achọ ịnata amara nʼihu gị.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Job 11:19
17 Iomraidhean Croise  

Ala-eze Jehoshafat we di jū: n'ihi na Chineke-ya mere ka o zuru ike buruburu.


I gātukwasi kwa obi, n'ihi na olile-anya di; I gēnyocha kwa, were ntukwasi-obi dina.


Ọ buru unu ihe-efu, unu ndi nēbili n'isi-ututu, ndi nāla azu n'inọdu ala, Ndi nēri nri nke ihe-nb͕u di iche iche: Otú a ka Ọ nēnye ndi Ọ huru n'anya ura.


N'udo ka m'gēji otù mb͕e ahu dina ala, raru ura: N'ihi na Gi onwe-gi, Jehova, nání Gi, nēme ka m'biri na ntukwasi-obi.


Ada Taia gēwere kwa onyinye-inata-iru-ọma bia; Ndi-ọgaranya nke ndi-gi gēme ka iru-gi dajua.


Ọtutu madu nāchọ ime ka iru onye amara aha-ya dajua: Onye ọ bula bu-kwa-ra onye nēnye onyinye eyì.


Ọ buru na i dina ala, i gaghi-atu oké egwu: E, i gēdina ala, ura-gi gātọ kwa utọ.


Arapuwo obodo nile nke Aroea, ìgwè di iche iche aturu ka ha gādiri, nke gāmakpu, ọ dighi kwa onye nēme ka ha ma jijiji.


Otú a ka Jehova siri, Ihe putara na ndọb͕u Ijipt nādọb͕u onwe-ya n'ọlu, na ọzuzu-ahia nke Etiopia, na ndi Saba, ndi toro ogologo, gāgabigakute gi, ndi i nwere ka ha gābu kwa; gi ka ha gēso n'azu; na nkpọrọ ka ha gāgabiga: ọ bu kwa gi ka ha gākpọ isi ala nye, gi ka ha gēkpere, si, N'ezie nime gi ka Chineke nọ; ọ dighi kwa onye ọzọ di, ọ dighi otù Chineke efu di ma-ọli.


Ọzọ, umu nke ndi nēweda gi n'ala gējekuru gi nēruda n'ala; ndi nile nke nēlelì gi anya gākpọ kwa isi ala n'ọbu-ukwu nke ukwu-gi abua; ha gākpọ kwa gi, Obodo Jehova, Zaion nke Onye Nsọ nke Israel.


Ha agaghi-abu-kwa-ra mba nile ihe-nluta-n'agha ọzọ, anu-ọhia nke uwa agaghi-eri kwa ha; ma ha gēbi na ntukwasi-obi, ọ dighi kwa onye ganēme ka ha ma jijiji.


M'gēnye udo n'ala, unu gēdina kwa ala, ọ dighi kwa onye ganēme ka unu ma jijiji: M'gēme kwa ka ajọ anu-ọhia kwusi n'ala, mma-agha agaghi-agabiga kwa n'ala-unu.


Ma ha gēbi, onye ọ bula n'okpuru osisi vine ya na n'okpuru osisi fig ya; ọ dighi kwa onye gēme ka ha ma jijiji: n'ihi na ọnu nke Jehova nke usu nile nke ndi-agha ekwuwo okwu.


Ndi Israel fọduru agaghi-eme ajọ omume, ha agaghi-ekwu kwa okwu-agha; agaghi-ahu kwa ire aghughọ n'ọnu-ha: n'ihi na ndi ahu gāzù onwe-ha makpu kwa amakpu dika aturu, ọ dighi kwa onye ganēme ka ha ma jijiji.


Le, anamenye ufọdu nime ulo-nzukọ, ahu nke Setan, nime ndi si na ha bu ndi-Ju, ma ha abughi, kama ha nēkwu okwu-ugha; le, M'gēme ka ha bia kpọ isi ala n'iru ukwu-gi, ka ha mara kwa na Mu onwem huru gi n'anya.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan