Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Job 11:17 - Bible Nso

17 Kari etiti-ehihie ka ubọchi ndu-gi gēbili kwa; Ọ buru na oké ọchichiri adi, ọ gādi ka ututu.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

17 Ndụ gị ga-amụke karịa etiti ehihie, ọchịchịrị ya ga-adịkwa ka ụtụtụ.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Job 11:17
17 Iomraidhean Croise  

Devid we gọzie Jehova n'anya nkpọkọta ahu nile: Devid we si, Onye agọziri agọzi ka I bu, Jehova, bú Chineke Israel nna-ayi, site na mb͕e ebighi-ebi we rue mb͕e ebighi-ebi.


I gātukwasi kwa obi, n'ihi na olile-anya di; I gēnyocha kwa, were ntukwasi-obi dina.


N'ihi na mb͕e ahu ihe nke onye puru ime ihe nile gātọ gi utọ, I gēwelite-kwa-ra Chineke iru-gi.


I gēkwubì kwa okwu, ewe me ka o guzosiere gi ike; Ìhè gāmukwasi kwa uzọ-gi nile.


Mb͕e o nēnwu n'elu isim, bú oriọna-Ya, Ìhè-Ya ka m'nēji eje ije n'ọchichiri;


Ihè awaliwo n'ọchichiri nye ndi ziri ezi: Ọ bu onye-amara, na onye nwere obi-ebere, na onye ezi omume.


Ọ gēme kwa ka ezi omume-gi puta dika ìhè, Ikpé-gi kwa dika etiti-ehihie.


Ha gānọ nāmi nkpuru n'isi-awọ; Osisi nke miri di ha n'aru ri nne, nke nwezu-kwa-ra akwukwọ ndu, ka ha gābu.


Aghaworo onye ezi omume ìhè dika nkpuru, Aghawo-kwa-ra ndi ziri ezi n'obi ọṅù.


Ma okporo-uzọ ndi ezi omume di ka ìhè nēnwu enwu, Nke nāmu aga n'iru n'iru rue mb͕e chi bọchara.


Ka ayi mara kwa, ka ayi b͕aso imara Jehova; dika chi-ọbubọ, otú a ka ọpupu-Ya guzosiworo ike: Ọ gābiakute kwa ayi dika oké miri-ozuzo, dika miri-ozuzo ikpe-azu nke nēzosa ala.


Ma unu ndi nātu egwu aham ka anyanwu nke ezi emume gāwara, ọgwugwọ di kwa na nkù; unu gāpu kwa, wulie elu dika umu-ehi nke ulo ebe anēme ka anu ma abuba.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan