Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Job 11:16 - Bible Nso

16 N'ihi na gi onwe-gi gēchezọ ọnọdu ọjọ gi, Dika miri nke gabigara agabiga ka i gēcheta ya:

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

16 Nʼezie ị ga-echefukwa nsogbu gị, na-echeta ya dịka mmiri gabigara agabiga.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Job 11:16
12 Iomraidhean Croise  

Josef we kpọ aha ọkpara-ya Manase: si, N'ihi na Chineke emewom ka m'chezọ ndọb͕u nile m'dọb͕uru onwem n'ọlu na ulo nile nke nnam.


M'gēme kwa ka ọb͕ub͕a-ndum guzosi ike n'ebe unu nọ: agaghi-ebipu kwa anu-aru nile ọzọ site na miri nke iju-miri ahu; iju-miri agaghi-adi kwa ọzọ ibibi uwa.


Ma-ọbu ọchichiri, nke i nādighi-ahu anya, Na njubiga miri nēkpuchi gi.


Umu-nnem aghọb͕uwom dika miri-iyi, Dika ebe miri-iyi nke nērùbiga nērù;


Ya ṅua, we chezọ ob͕eye ọ bu, Ghara kwa icheta ọnọdu ọjọ ya ọzọ.


N'ihi na ọ gaghi-echeta ubọchi nile nke ndu-ya ri nne; n'ihi na Chineke nāza ya n'ọṅù obi-ya.


Atula egwu; n'ihi na ihere agaghi-eme gi: ka aghara itiye kwa gi n'ọnọdu-ihere; n'ihi na agaghi-eme gi ka i nwe iru-ihere: n'ihi na i gēchezọ ihere nke mb͕e i nọ na nwata, ọzọ, ita-uta nke ọnọdu nwayi di-ya nwuru i nọ, i gaghi-echeta ya ọzọ.


N'ihi na otú miri nke Noa ka nka dirim: n'ihi na dika M'ṅuru iyi, si na miri nke Noa agaghi-erubiga kwa uwa ọzọ, otú a ka M'ṅuworo iyi, si na M'gaghi-ewesa gi iwe, na M'gaghi-abasiri gi nba ike.


onye ahu nke nāgọzi onwe-ya n'uwa ewe gọzie onwe-ya nime Chineke nke ezi-okwu; onye ahu kwa nke nāṅu iyi n'uwa gēji Chineke nke ezi-okwu ṅua; n'ihi na echezọwo ahuhu mbu nile, na n'ihi na ezonariwo ha n'anyam abua.


Nwanyi, mb͕e ọ bula ime nēme ya, o nwere ihe-nwuta, n'ihi na oge hour ya abiawo: ma mb͕e ọ bula ọ muputara nwa, o chetaghi ahuhu-ya ọzọ, n'ihi ọṅù-ya na amuputara madu n'uwa.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan