Ghara kwa idi ka ndi bu nna-ha, Ndi bu ọb͕ọ nēwezuga onwe-ha nke nānupu kwa isi; Ọb͕ọ ndi nēdozighi obi-ha, Ndi mọ-ha nēkwesighi ntukwasi-obi n'ebe Chineke nọ.
Moses we si ya, Mb͕e m'si n'obodo pua, M'gāb͕asara Jehova ọbu-akam abua; éb͕è-elu-igwe nile gākwusi, ákú-miri-ígwé agaghi-adi kwa ọzọ; ka i we mara na Jehova nwe uwa.
Samuel we gwa ulo Israel nile okwu, si, Ọ buru na obi-unu nile ka unu onwe-unu nēwere laghachikute Jehova, wezuganu chi nile nke ndi ala ọzọ na Ashtarot n'etiti unu, dozie obi-unu ibiakute Jehova, fè-kwa-nu nání Ya òfùfè: Ọ gānaputa kwa unu n'aka ndi Filistia.