Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Job 11:13 - Bible Nso

13 Ọ buru na gi onwe-gi edozie obi-gi, We b͕asa ọbu-aka-gi abua n'ebe Ọ nọ;

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

13 “Ma ọ bụrụ na i were obi gị nye ya, setịpụ aka gị abụọ nye ya,

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Job 11:13
18 Iomraidhean Croise  

O we me ihe ọjọ, n'ihi na o dozighi obi-ya ichọ Jehova.


Otú ọ di, achọtawo ezi ihe n'aka-gi, n'ihi na i mewo ka Asherot si n'ala nka gabiga, i we dozie obi-gi ichọ Chineke.


Gini mere obi-gi ji ebupu gi? Gini me-kwa-ra anya-gi abua ji atabi?


Ọ buru na i laghachikute Onye puru ime ihe nile, agēwuli gi elu dika ulo; I gēme ka ajọ omume di anya n'ebe ulo-ikwū-gi nile di.


I gāriọ Ya aririọ, Ọ gānu kwa gi; I gākwughachi kwa nkwa-gi nile.


Le, onye ihe nāgara nke-ọma ka madu ahu bu, onye Chineke nābara nba: Aju-kwa-la idọ-aka-na-nti nke Onye puru ime ihe nile.


Ma mu onwem, m'gāchọ Chineke, Chineke ka m'gēbo kwa okwum:


Ab͕asawom akam abua n'ebe I nọ: Nkpuru-obim di ka ala nke ida-#mbà n'ebe I nọ. Selah


Ndi amara aha-ha gēsi n'Ijipt puta; Etiopia gēsetiri Chineke aka-ya abua ngwa ngwa.


N'ubọchi nkpab͕um Onye-nwe-ayi ka m'chọrọ: Akam setiri eseti n'abali, o sinwukwaghi; Nkpuru-obim juru ka akasie ya.


Ghara kwa idi ka ndi bu nna-ha, Ndi bu ọb͕ọ nēwezuga onwe-ha nke nānupu kwa isi; Ọb͕ọ ndi nēdozighi obi-ha, Ndi mọ-ha nēkwesighi ntukwasi-obi n'ebe Chineke nọ.


Anyam adalawo n'isi site na nweda-n'ala: Jehova, akpọkuwom I kwa-ubọchi, Ab͕asawom ọbu-akam abua n'ebe I nọ.


Moses we si ya, Mb͕e m'si n'obodo pua, M'gāb͕asara Jehova ọbu-akam abua; éb͕è-elu-igwe nile gākwusi, ákú-miri-ígwé agaghi-adi kwa ọzọ; ka i we mara na Jehova nwe uwa.


Ka ayi weliere Chineke Nke bi n'elu-igwe obi-ayi n'ọbu-aka-ayi abua.


Ọzọ, orù ahu, nke mara ihe onye-nwe-ya chọrọ, ma o dozighi, o meghi kwa dika ọ chọrọ, agāpia ya ọtutu utari;


Samuel we gwa ulo Israel nile okwu, si, Ọ buru na obi-unu nile ka unu onwe-unu nēwere laghachikute Jehova, wezuganu chi nile nke ndi ala ọzọ na Ashtarot n'etiti unu, dozie obi-unu ibiakute Jehova, fè-kwa-nu nání Ya òfùfè: Ọ gānaputa kwa unu n'aka ndi Filistia.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan