13 Ma I zoro ihe ndia n'obi-Gi; Amawom na nka di n'aka-Gi:
13 “Ma nke a bụ ihe i zoro nʼime obi gị, amakwa m na ọ bụ ihe dị gị nʼuche.
Ọ buru na emehiewom, I nēlezikwam anya, I gaghi-agupukwam n'ajọ omumem.
Ma Ya onwe-ya nọ n'otù èchìchè, ònye kwa gechighari Ya? Nkpuru-obi-Ya achọsiwo kwa ike, O we me ya.
N'ihi na Ọ nēmezu ihe bu òkèm: Ma ọtutu ihe dika ihe ndia di n'aka-Ya.
M'ga n'aka-ekpe, mb͕e Ọ nālu ọlu, ma adighm-ahu Ya anya: Ọ nēkpuchi Onwe-ya n'aka-nri, m'we ghara ihu Ya.
N'ezie Gi onwe-gi bu Chineke Nke nēzobe Onwe-gi, Gi Chineke Israel, bú Onye-nzọputa.
Abum Onye nākpu ìhè na Onye nēkè ọchichiri; abum Onye nēme udo na Onye nēkè ihe ọjọ: Mu onwem bu Jehova, Onye nēme ihe ndia nile.
Ònye bu onye ahu nke kwuworo okwu, o we rè, mgbe onyenwe-ayi enyeghi iwu?
A! omimi nke àkù nke amam-ihe na nke ihe-ọmuma kwa nke Chineke! le otú anēnweghi ike ichọputa ikpé-Ya nile, otú anēnweghi kwa ike ituputa uzọ-Ya nile!
dika ìzù nke mb͕e nile ebighi-ebi si di nke O zubere nime Kraist-ayi, bú Jisus Onye-nwe-ayi:
Ub͕u a, hunu na Mu onwem, Mu onwem bu Ya, Ọ dighi kwa chi ọzọ Mu na ya nọ: Mu onwem nēme ka anwua, M'nēme kwa ka adi ndu; M'tib͕uwo etib͕u, Mu onwem gēme kwa ka aru di ike: Ọ dighi kwa onye nānaputa n'akam.