Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Job 10:1 - Bible Nso

1 Ike ndum agwuwo nkpuru-obim; Ka m'rapuru onwem ntamum; Ka m'kwue okwu n'idi-ilu nke nkpuru-obim.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

1 “Ike ịdị ndụ agwụla m. Hapụnụ m ka m kwuo ihe dị m nʼobi, kwupụta ya dịka obi ilu nke mkpụrụobi m si dị.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Job 10:1
21 Iomraidhean Croise  

Ma ya onwe-ya jere ije otù ubọchi n'ọzara, bia nọdu n'okpuru otù osisi broom: ọ riọ Chineke ndu-ya ka ọ nwua, si, O zuwo; ub͕u a, Jehova, wepu ndum; n'ihi na mu onwem adighi nma kari nnam-hà.


Ọ gādim nọ̄ nma ma asi na I zobem n'ala-mọ, Ma asi na I debem na nzuzo, rue mb͕e iwe-Gi laghachiri, Ma asi na I kparam ókè, we chetam!


Ọzọ kwa, ọ bu ezie na emehiewom n'amaghi-ama, Ma n'ebe m'nọ ka nmehiem m'mehiere n'amaghi-ama di.


N'oké unwu Ọ b͕aputawo gi n'ọnwu; B͕aputa kwa gi n'aka mma-agha n'agha.


Ùnu nēchè na unu gābara okwu nba? Ebe okwu-ọnu nile nke onye nādighi-atukwasi obi-ya n'ihe di ka ifufe.


Mu onwem kwa, m'gaghi-eb͕ochi ọnum; Ka m'kwue nime nkpab͕u nke mọm; Ka m'tamue ntamu n'idi-ilu nke nkpuru-obim.


Ajuwom ndu; m'gaghi-adi ndu rue mb͕e ebighi-ebi: Rapum; n'ihi na otù nku-ume ka ubọchim nile bu.


Onye zuru okè ka m'bu; adighm-amara nkpuru-obim; Ajum ndum.


Gini ka m'gēkwu? Ọ gwaram okwu, Ya onwe-ya me-kwa-ra ya: M'ganēje nwayọ arọm nile n'ihi idi-ilu nke nkpuru-obim.


Le, ihe m'ji nwe ihe di ilu ilu bu ka m'we nata udo: Ma Gi onwe-gi huru nkpuru-obim n'anya si-ike, we si n'olùlù nke itọb͕orọ-n'efu dọputam: N'ihi na I tufuru nmehiem nile n'azu Gi.


Ma ub͕u a, Jehova, biko, wepu ndum n'arum; n'ihi na ọ kam nma inwu ọnwu kari idi ndu.


O rue, mb͕e anyanwu wara, na Chineke guputara otù ifufe Iru-anyanwu di ọku; anyanwu we tikwasi Jona n'isi, ike we gwusia ya, o we riọ Chineke ndu-ya ka ọ nwua, si, Ọ kam nma inwu ọnwu kari idi ndu.


Ma ọ buru na otú a ka Gi onwe-gi nēmem, biko, gbuziem, ọ buru na ahutawom amara n'iru Gi; ka m'ghara kwa ilekwasi ihe ọjọm anya.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan