Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Job 1:16 - Bible Nso

16 Mb͕e onye a nọ nēkwu, onye ọzọ bia-kwa-ra, si, Ọku nke Chineke esiwo n'elu-igwe da, rechapu ìgwe ewu na aturu, na ndi nējere gi ozi, ripia ha; nání mu onwem we b͕apu, náním, igosi gi.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

16 Mgbe ọ ka kpụ okwu nʼọnụ, onyeozi ọzọ gbabatara kwuo sị, “Ọkụ Chineke zitere sitere na mbara eluigwe daa rechapụ igwe atụrụ na ndị ohu niile. Ọ bụ naanị m bụ onye gbapụtara ịgwa gị ihe mere.”

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Job 1:16
13 Iomraidhean Croise  

Jehova we me ka brimstone na ọku si n'elu-igwe zokwasi Sọdọm na Gọmọra dika miri site n'ebe Jehova nọ;


Ọku Jehova we da, ripia àjà-nsure-ọku ahu, na nkú-ya, na nkume nile, na àjà, rachapu kwa miri nke di n'ebe ahu miri dọrọ.


Elaija we za, si onye-isi ọgu ndi-agha abua na iri ahu, Ọ buru na onye nke Chineke ka m'bu, ka ọku si n'elu-igwe ridata, ripia gi na ọgu ndi-agha abua na iri gi. Ọku we si n'elu-igwe ridata, ripia ya na ọgu ndi-agha abua na iri ya.


Elaija we za, si ha, Ọ buru na onye nke Chineke ka m'bu, ka ọku si n'elu-igwe ridata, ripia gi na ọgu ndi-agha abua na iri gi. Ọku nke Chineke we si n'elu-igwe ridata, ripia ya na ọgu ndi-agha abua na iri ya.


Le, ọku siri n'elu-igwe ridata, ripia ndi-isi abua mbu ahu nke ọgu ndi-agha abua na iri, ha na ọgu ndi-agha abua na iri ha: ma ub͕u a ka ndum di oké ọnu-ahia n'anya-gi.


Ke mma-agha-gi n'úkwù-gi, gi dike, Ebube-gi na ima-nma-gi.


Riọnu Jehova; n'ihi na o zuwo, bú olu Chineke na ákú-miri-ígwé ndia; m'gēzipu kwa unu, unu agaghi-eguzo kwa ọzọ.


Ọku we si n'iru Jehova puta, ripia ha, ha we nwua n'iru Jehova.


Ọku we si n'iru Jehova puta, ripia àjà-nsure-ọku na abuba nile n'elu ebe-ichu-àjà: ndi Israel nile we hu ya, tie nkpu, da kpue iru-ha n'ala.


Otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova mere ka m'hu: ma, le, Jehova nākpọ òkù ka Ya na ndi-Ya kpe ikpe site n'ọku; o we ripia oké ob͕u-miri, we nēripia òkè a, bú ala Israel.


ọ nēme kwa oké ihe-iriba-ama di iche iche, ka o we me ọbuná ọku ka o si n'elu-igwe ridata n'uwa n'iru madu nile.


Ọma-jijiji we di n'ọmuma-ulo-ikwū, na n'ọhia, na n'etiti ndi ahu nile; ndi ebe-nguzo-ndi-agha na ndi-nbibi, ha onwe-ha ma-kwa-ra jijiji: ala de-kwa-ra ùdé; o we ghọ ọma-jijiji nke Chineke.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan