Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Job 1:15 - Bible Nso

15 ndi Sheba we dakwasi ha, chiri ha; ọzọ kwa, ha ewerewo ọnu mma-agha tib͕ue ndi nējere gi ozi; nání mu onwem we b͕apu, náním, igosi gi.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

15 ndị Sheba bịara lụsoo anyị ọgụ ma chịkọrọ ha laa. Ha ji mma agha gbuo ndị ọhụ gị, maọbụ naanị m bụ onye gbapụtara ịgwa gị.”

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Job 1:15
13 Iomraidhean Croise  

na Obal, na Abimael, na Sheba;


Umu-ndikom Kush kwa; Seba, na Havila, na Sabta, na Reama, na Sabteka: umu-ndikom Reama kwa; Sheba, na Dedan.


Jọkshan muru Sheba, na Dedan. Umu Dedan we buru Ashurim, na Letushim, na Leumim.


na onye-ozi biakutere Job, si, Ìgwè ehi nādọ ihe eji gwu ala-ubi, ìgwè nne-inyinya-ibu nāta nri n'akuku ha:


ma, le, oké ifufe siri n'ofè ọzara bia, tie nkuku anọ nke ulo ahu, o we dakwasi umu-okorọbia ahu, ha we nwua; nání mu onwem we b͕apu, náním, igosi gi.


Ndi-ije nke Tima legidere anya, Usu-ndi-ije nke Sheba lere anya ha.


Ndi-eze Tashish na nke ala nile di oké osimiri buruburu gēnye onyinye-inata-iru-ọma: Ndi-eze Sheba na Seba gēweta ùtú nso.


Otú a ka Jehova siri, Ihe putara na ndọb͕u Ijipt nādọb͕u onwe-ya n'ọlu, na ọzuzu-ahia nke Etiopia, na ndi Saba, ndi toro ogologo, gāgabigakute gi, ndi i nwere ka ha gābu kwa; gi ka ha gēso n'azu; na nkpọrọ ka ha gāgabiga: ọ bu kwa gi ka ha gākpọ isi ala nye, gi ka ha gēkpere, si, N'ezie nime gi ka Chineke nọ; ọ dighi kwa onye ọzọ di, ọ dighi otù Chineke efu di ma-ọli.


Olu ìgwè madu ndi nọ n'udo di kwa nime ya: tukwasi kwa ndikom ndi sitere n'ọra madu, emewo ka ndi nāṅubiga manya ókè si n'ọzara bia; ha we tiye ọla-aka n'aka nke ndinyom ahu, na okpu-eze mara nma n'isi-ha.


ọ̀ gaghi-adi n'ubọchi ahu na onye b͕apuru ab͕apu gābiakute gi, ime ka i were nti-gi abua nu ya?


M'gēre kwa umu-unu ndikom na umu-unu ndinyom nye n'aka umu Juda, ha ewe re ha nye ndi Sheba, bú mba di anya: n'ihi na Jehova ekwuwo.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan