Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Jeremaya 9:4 - Bible Nso

4 Lezienu anya, onye ọ bula onye-ab͕ata-obi-ya, unu atukwasi-kwa-la nwa-nne ọ bula obi: n'ihi na nwa-nne ọ bula nējidesi ikiri-ukwu nwa-nne-ya ike, ọzọ, onye-ab͕ata-obi ọ bula nējeghari nāb͕a àmà ọjọ.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

4 “Lezie anya, gbaara enyi gị ọsọ. Atụkwasịkwala nwanne gị obi. Nʼihi na nwanne ọbụla na-aghọ aghụghọ. Ndị enyi niile bụkwa ndị nkwutọ.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Jeremaya 9:4
28 Iomraidhean Croise  

Ọ si, Ọ bughi Jekob ka agākpọ aha-gi ọzọ, kama Israel: n'ihi na i jisiwo ike n'ebe Chineke nọ na n'ebe madu nọ, i we nwe ike.


Onye nēkpè madu-ibe-ya ikpè na nzuzo, onye ahu ka m'gēkpochapu: Onye nwere anya npako na obi di nganga, onye ahu ka m'nāpughi inagide.


O jighi ire-ya kwue okwu-azu, Ọ meghi madu-ibe-ya ihe ọjọ, O bulighi kwa ita-uta megide onye-ab͕ata-obi-ya.


Onye nēkpuchi ikpọ-asì nwere eb͕ub͕ere-ọnu okwu-ugha; Ọzọ, onye nēme ka akukọ ọjọ puta, onye ahu bu onye-nzuzu.


Otùtù-agha na mma-agha na àkú di nkọ Ka onye nke nāb͕a àmà okwu-ugha megide madu-ibe-ya bu.


N'ihi na ha adighi-araru ura, ọ buru na ha adighi-eme ihe ọjọ; Anapuwo kwa ura-ha n'ike, ọ buru na ha adighi-eme ka madu su ngọngọ.


N'ihi na ha eriwo nri nke nmebi-iwu, Ọ bu kwa manya nke ihe-ike ka ha nāṅu.


Ihe isi di nke Jehova kpọrọ asì; E, ihe asa di nke bu ihe-árú nke nkpuru-obi-Ya:


Na onye-àmà okwu-ugha nke nēkupu okwu-ugha di iche iche dika ume, Na onye nēzisa ise-okwu n'etiti umu-nne.


njehie, na igọnari Jehova, na isi n'iso Chineke-ayi laghachi azu, na ikwu okwu nmeb͕u na nwezuga, na ime okwu-ugha nile site n'obi-ayi, na ikwuputa ha.


Ndi-nduzi nke ndi nka we ghọ ndi nēme ka ha wagharia; ọzọ, ndi-ha anēduzi eduzi bu ndi anēloda eloda.


N'ihi na ọbuná umu-nne-gi, na ulo nna-gi, ọbuná ha onwe-ha aghọb͕uwo gi; ọbuná ha onwe-ha akpọzuwo nkpu n'azu gi: ekwela ha, mb͕e ha gāgwa gi ezi ihe.


Ha nile bu ndi nēwezuga onwe-ha nke-uku, nējeghari dika onye nāb͕a àmà ọjọ: ọla na ígwè ka ha bu: ndi ahu nile bu ndi-nbibi.


Àkú nke nēb͕u eb͕u ka ire-ha bu; okwu aghughọ ka o kwuworo: n'ọnu-ya ka madu nāgwa onye-ab͕ata-obi-ya okwu udo, ma n'obi-ya ọ nēche ya anwu.


Ndi nāb͕a àmà ọjọ anọwo nime gi iwusi ọbara: ọ bu kwa n'ugwu nile ka ha riworo ihe nime gi: ajọ ihe-nzube ka ha meworo n'etiti gi.


Ejegharila n'etiti umu-nna-gi dika onye nāb͕a àmà ọjọ: eguzola imegide ọbara madu-ibe-gi: Mu onwem bu Jehova.


Ọ̀ bughi otù Nna ka ayi nile nwere? ọ̀ bughi otù Chineke keworo ayi? gini mere ayi nāghọḅu, onye ọ bula ọ ghọḅu ibe-ya, nēme ka ọḅuḅa-ndu nna-ayi-hà ghara idi nsọ?


Ma nēzenu madu: N'ihi na ha gārara unu nye n'aka nnọkọ-ikpé di iche iche, n'ulo-nzukọ nile ha ka ha gāpia kwa unu ihe;


Nwa-nne gārara kwa nwa-nne-ya nye n'ọnwu, nna gārara kwa nwa-ya nye: umu gēbili kwa megide ndi muru ha, me ka ha nwua anwu.


Ma ọbuná ndi muru unu, na umu-nne-unu, na ndi-ikwu-unu, na ndi-eyì-unu, gārara unu nye; ha gēme kwa ka ufọdu nime unu nwua ọnwu.


ka onye ọ bula ghara ighọb͕u na irib͕u nwa-nna-ya n'ihe a: n'ihi na Onye-nwe-ayi bu onye nābọ̀ ọ́bọ̀ bayere ihe ndia nile, dika ayi bu-kwa-ra uzọ gwa unu gwasi kwa unu ike.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan