Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Jeremaya 9:25 - Bible Nso

25 Le, ubọchi nābia, (ọbu ihe si N'ọnu Jehova puta), mb͕e M'gewere nmehie-ha leta ndi nile bìri úgwù n'ebìghi-úgwù-ha;

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

25 “Lee, ụbọchị ahụ na-abịa,” ka Onyenwe anyị kwupụtara, “mgbe m ga-ata ndị ahụ niile nke e biri ugwu naanị nʼanụ ahụ ha ahụhụ.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Jeremaya 9:25
17 Iomraidhean Croise  

Dedan, na Tima, na Buz, na ndi nile akọpuworo usọ isi-ha;


Bìenu onwe-unu úgwù nye Jehova, bìenu onwe-unu úgwù n'obi, unu ndikom Juda na ndi bi na Jerusalem: ka ọnuma m we ghara ipu dika ọku, we re nke ọ nādighi onye nēmenyu, site n'ihe ọjọ nke omume nile unu.


Camel nile ha gāghọ kwa ihe-nluta-n'agha, ìgwè anumanu-ha gāghọ kwa ihe-nkwata: M'gēfesa-kwa-ra ifufe nile ndi akọpuworo usọ isi-ha; ọ bu kwa n'ofè-ya nile ka M'gēme ka nhuju-anya-ha si bia; ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta.


Ọnwu nke ndi anēbighi úgwù ka i gānwu site n'aka ndi ala ọzọ: n'ihi na Mu onwem ekwuwo okwu; ọ bu ihe si n'ọnu Onye-nwe-ayi Jehova puta.


Ònye ka i yiri otú a nime nsọpuru na n'idi-uku n'etiti osisi nile nke Iden? ma emewo ka i rida, gi na osisi nile nke Iden, rue ala di n'okpuru uwa: n'etiti ndi anēbighi úgwù ka i gēdina, gi na ndi ejiri mma-agha b͕u. Nka bu Fero-na ìgwè ndi-ya nile; ọ bu ihe si n'ọnu Onye-nwe-ayi Jehova puta.


ebe unu meworo ka ndi ala ọzọ bata, bú ndi anēbighi úgwù n'obi anēbighi kwa úgwù n'anu-aru, inọ n'ebe nsọm, ime ka ọ ghara idi nsọ, bú ulom, mb͕e unu nēweta nrim nso, bú abuba na ọbara, ha we mebie ọb͕ub͕a-ndum, tiyere ihe-árú nile unu.


Unu akọpula usọ isi-unu buruburu, ebibi-kwa-la usọ afu-ọnu-gi.


Mu onwem we nējeghari kwa n'imegide ha, me ka ha ba n'ala ndi iro ha: ma ọ buru na obi-ha nke anēbighi úgwù eruru ala mb͕e ahu, ọ buru kwa na ahuhu ajọ omume-ha atọ ha utọ mb͕e ahu;


Nání unu ka M'maworo n'etiti ab͕uru nile nke uwa: n'ihi nka ka M'gēji ajọ omume nile unu leta unu.


N'ihi na onye nke bu onye-Ju n'anya madu abughi onye-Ju; obibì-úgwù ahu nke madu nāhu anya, nke di n'anu-aru, abughi kwa obibì-úgwù:


kama onye nke bu onye-Ju n'ihe zoro ezo, onye ahu bu onye-Ju; obibì-úgwù bu kwa nke nkpuru-obi, nime mọ, ọ bughi n'ihe edeworo n'akwukwọ; nke otuto-ya nēsiteghi n'aka madu, kama o sitere n'aka Chineke.


Jonatan we si nwa-okorọbia nēbu ihe-agha-ya, Bia, ka ayi gabiga rue ebe-nguzo-ndi-agha nke ndia anēbìghi úgwù: eleghi anya Jehova gāluru ayi ọlu: n'ihi na ihe-nb͕ochi adighi n'ebe Jehova nọ izọputa site n'iwere ọtutu madu ma-ọbu site n'iwere madu ole-na-ole.


Devid we gwa ndikom ndi ya na ha nēguzo okwu, si, Gini ka agēmere nwoke nke gētib͕u onye Filistia nka, wezuga ihe-ita-uta n'aru Israel? n'ihi na ònye bu onye Filistia nka nke anēbìghi úgwù, na ọ gāta usoro-agha nile nke Chineke di ndu uta?


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan