Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Jeremaya 9:22 - Bible Nso

22 Kwue, si, Otú a ka ihe nke si n'ọnu Jehova puta siri, Ozu madu gāda dika ǹsí-anu n'ọhia, na dika nju-aka ọka n'azu onye nēwe ihe-ubi, ọ dighi kwa onye nāchikọta ha.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

22 Gwa ha, sị, “Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri, “ ‘Ozu ndị nwụrụ anwụ ga-atọgbọrọ dịka unyi e kpofuru nʼọhịa, dịka ukwu ọka nke e gbuturu nʼazụ onye na-aghọ mkpụrụ ubi, nke ọ dịghị onye ga-achịkọta ha.’ ”

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Jeremaya 9:22
17 Iomraidhean Croise  

Hezekaia we ge ha nti, me ka ha hu ulo nile nke ihe-ya di oké ọnu-ahia, bú ọla-ọcha-ya, na ọla-edo-ya, na uda-ya di iche iche, na ezi manu-ya, na ulo ihe-agha-ya nile, na ihe nile nke achọtara n'àkù-ya nile: ọ dighi ihe di n'ulo-ya, ma-ọbu n'ala nile ọ nāchi, nke Hezekaia nēmeghi ka ha hu.


Ọ si, Gini ka ha huru n'ulo-gi? Hezekaia we si, Ihe nile nke di n'ulom ka ha huru: ọ dighi ihe di n'àkùm nile nke m'nēmeghi ka ha hu.


ozu Jezebel gādi kwa ka ǹsí-anu n'elu ubi n'òkè-ala-ubi Jezreel; ha ewe ghara isi, Nka bu Jezebel.


Ọ nējide ndi mara ihe n'aghughọ-ha: Ndum-ọdu nke ndi nāb͕a nb͕a me-kwa-ra ngwa.


Ọ dighi onye ọ bula gāb͕aputa nwa-nne-ya ma-ọli, Ọ gaghi-enye Chineke ihe-nb͕aputa-ya:


Ekpochapuru ha n'En-doa; Ha ghọro ǹsí eji mezi ala.


Àkù ọgaranya bu obodo-ya siri ike, Ọ di kwa ka mb͕idi di elu nime ntughari-obi-ya nile.


Adọb͕ula onwe-gi n'ọlu ibu ọgaranya; Site na nghọta-gi ra ya aka.


N'ihi nka ka iwe Jehova di ọku n'aru ndi-Ya, O we setipu aka-Ya megide ha, tib͕ue ha, ugwu nile we ma jijiji, ozu ndi ahu we di ka ǹsí-anu n'etiti èzí nile. N'ihe a nile iwe-Ya alaghachighi azu, kama rue ub͕u a ka aka-Ya nēseti eseti.


Site n'ọnwu nke ọria di iche iche ka ha gānwu; agaghi-etiri ha aka n'obi, agaghi-elì kwa ha; ǹsí-anu n'elu ala ka ha gāghọ: ha gēsite kwa na mma-agha, site kwa n'oké unwu, gwusia; ozu-ha gāghọ-kwa-ra anu-ufe nke elu-igwe, ghọ-kwa-ra anumanu nke uwa, ihe-oriri.


Ndi Jehova b͕uru gādizu kwa n'ubọchi ahu site n'otù nsọtu uwa we rue nsọtu ọzọ nke uwa: agaghi-etiri ha aka n'obi, agaghi-achikọta kwa ha, agaghi-elì kwa ha; ǹsí-anu n'elu ala ka ha gāghọ.


N'ihi nka ka Jehova ji kwue otú a, si, Le, M'ganētiye ihe-isu-ngọngọ di iche iche n'iru ndi nka: nna na umu-ha gāsukwasi kwa ha ngọngọ; onye-ab͕ata-obi na eyì-ya gāla n'iyì.


Ozu ndi nka gāghọ-kwa-ra anu-ufe nke elu-igwe, ghọ-kwa-ra anumanu nke uwa, ihe-oriri; ọ dighi kwa onye nāruli ha.


ha gāb͕asa ha n'anyanwu, na n'ọnwa, na n'usu nile nke ihe elu-igwe, nke ha huworo n'anya, nke ha fèwo-kwa-ra, nke ha jesowo-kwa-ra, nke ha chọwo-kwa-ra, nke ha kpọwo-kwa-ra isi ala nye: agaghi-achikọta ha, agaghi-elì kwa ha; ǹsí-anu nke di n'iru ala ka ha gāghọ.


Mb͕e ahu ọ gēfebiga dika ifufe, o we gabiga, ikpe ama ya: ike-ya nka ewe ghọ chi-ya.


M'gēme kwa ka nkpà kpa madu, ha ewe jegharia dika ndi-ìsì, n'ihi na ọ bu Jehova ka ha mehieworo megide: agāwusi kwa ọbara-ha dika ájá, wusi kwa anu-aru-ha dika ǹsí.


i we si n'obi-gi, Ikem na ume akam emetaworom àkù a.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan