Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Jeremaya 9:20 - Bible Nso

20 Ma nurunu okwu Jehova, unu ndinyom, ka nti-unu nara kwa okwu ọnu-Ya, zí-kwa-nu umu-unu ndinyom igo-ákwá, ka nwayi ọ bula zí kwa nwayi-ibe-ya abù-ákwá.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

20 Ugbu a, nụrụnụ okwu Onyenwe anyị, unu ụmụ nwanyị, megheenụ ntị unu nụrụ okwu si ya nʼọnụ. Kuzierenụ ụmụ unu ndị inyom otu e si eti mkpu akwa, kuziekwaranụ ibe unu abụ akwa.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Jeremaya 9:20
15 Iomraidhean Croise  

Biko, nara iwu n'ọnu-Ya, Do kwa okwu-Ya nile n'obi-gi.


Jehova we si, N'ihi na umu-ndinyom Zaion di npako, nēwere kwa olu setiri eseti na anya nāràrá ndikom ejeghari, nārọ nma mb͕e ha nējeghari, nēwere kwa ukwu-ha eme ka ọla-ukwu-ha da udà:


M'gēwere kwa umu-okoro nye ka ha buru ndi-isi-ha, umu nāṅu ara gāchi kwa ha.


Ọzọ, ndi ahu nke ha onwe-ha nēburu amuma gābu ndi anētufu n'èzí nile nke Jerusalem n'ihi oké unwu na mma-agha; ọ dighi kwa onye nēlì ozu ha gēnwe, ha onwe-ha, na ndinyom-ha, na umu-ha ndikom, na umu-ha ndinyom: n'ihi na M'gāwukwasi ha ihe ọjọ ha.


Otú a ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha siri, Unu egela nti n'okwu nile nke ndi-amuma ahu ndi nēburu unu amuma; ndi nēme unu ihe-efu ka ha bu: ọhù nke obi-ha ka ha nēkwu, ha adighi-ekwu site n'ọnu Jehova.


Onye-amuma nke nrọ di ya n'ọnu, ya ze nrọ-ya; ọzọ, onye ahu okwum di ya n'ọnu, ya kwue okwum n'ezi-okwu. Gini ka okporo-ọka na ọka wheat nwekọrọ? ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta.


Ma ọnuma Jehova juputara nimem; ike gwurum inagide ya: wukwasi ya n'aru umu-ntakiri n'èzí, na n'aru ìzù umu-okorọbia n'otù: n'ihi na agēwere kwa ma di ma nwunye, ma okenye ma onye juputara n'ubọchi ndu-ya.


Kọpu isi-gi, Jerusalem, tufue ya, buli kwa abù-ákwá n'elu ebe nile di elu nke ọhia nādighi; n'ihi na Jehova ajuwo, rapu kwa ọb͕ọ nke nrubiga-ókè nke iwe-Ya.


ha gāb͕asa ha n'anyanwu, na n'ọnwa, na n'usu nile nke ihe elu-igwe, nke ha huworo n'anya, nke ha fèwo-kwa-ra, nke ha jesowo-kwa-ra, nke ha chọwo-kwa-ra, nke ha kpọwo-kwa-ra isi ala nye: agaghi-achikọta ha, agaghi-elì kwa ha; ǹsí-anu nke di n'iru ala ka ha gāghọ.


Ònye bu onye mara ihe, ka o we ghọta nka ònye bu kwa onye ahu ọnu Jehova gwaworo okwu, ka o we gosi ya? n'ìhi gini ka ala nka laworo n'iyì, esure kwa ya ọku dika ọzara, onye-ngabiga we ghara idi?


Bilie, tie nkpu n'abali, na nmalite nche di iche iche; Wusi obi-gi dika miri na ncherita-iru Onye-nwe-ayi: Chilie aka-gi n'ebe Ọ nọ n'ihi ndu umu-ntakiri-gi, Ndi nāda #mbà n'agu n'isi èsí nile.


Nwa-okoro na agadi-nwoke edinawo ala n'èzí nile; Umu-ab͕ọghọm nāmaghi nwoke na umu-okorọbiam adawo site na mma-agha: I b͕uwo ha n'ubọchi iwe-Gi; I b͕usiwo, I nweghi ọmiko.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan