Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Jeremaya 9:17 - Bible Nso

17 Otú a ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha siri, Tugharinu uche, kpọ-kwa-nu ndinyom nābù abù-ákwá, ka ha we bia; ziga-kwa-nu ikpọ ndinyom mara ihe, ka ha we bia:

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

17 Otu a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwuru, “Tụgharịanụ uche unu ugbu a. Kpọọnụ ụmụ nwanyị ndị ọrụ ha bụ ịbụ abụ akwa. E, zienụ ozi ka ndị ọkachamara nʼetiti ha bịa.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Jeremaya 9:17
12 Iomraidhean Croise  

Jeremaia we bùara Josaia abù-ákwá: ndi-abù ndikom na ndi-abù ndinyom nile we nēkwu okwu bayere Josaia rue ta n'abù-ákwá-ha; ha we tiye ha ibu ukpuru n'ebe Israel nọ: ma, le, edewo ha n'akwukwọ abù-ákwá.


Ka ha bua ya ọnu, bú ndi nābu ubọchi ọnu, Ndi nọ na njikere ikpọte leviathan.


ọzọ, ha gātu egwu ihe di elu, ihe-ujọ di iche iche gādi kwa n'uzọ; osisi almond gāb͕ọwa kwa okoko-ya, ukpala gāghọ kwa ibu, ọchichọ gāgwu kwa: n'ihi na madu nāla n'ulo ebighi-ebi ya, ndi nēti aka n'obi ewe jegharia n'amá buruburu:


Kọpu isi-gi, Jerusalem, tufue ya, buli kwa abù-ákwá n'elu ebe nile di elu nke ọhia nādighi; n'ihi na Jehova ajuwo, rapu kwa ọb͕ọ nke nrubiga-ókè nke iwe-Ya.


Onye-nwe-ayi adiwo ka onye-iro, Ọ lodawo Israel; O lodawo ulo-elu-ya nile, O bibiwo ebe-Ya nile ewusiri ike: O me ka ize-ume na isu-ude ba uba n'ada Juda.


Ma gi onwe-gi, nwa nke madu, buliere Taia abù-ákwá;


Abù-ákwá ka nka bu, nke ha gābù; umu-ndinyom nke mba nile gābù ya: n'ihi Ijipt na n'ihi ìgwè-ya nile ka ha gābù ya; ọ bu ihe si n'ọnu Onye-nwe-ayi Jehova puta.


Nurunu okwu a nke Mu onwem nēbuli n'isi unu ka ọ buru abù-ákwá, unu ulo Israel.


N'ubọchi ahu ka agātu ilu megide unu, gosie ákwá ike, si: Apunarisiwo ayi ihe: òkè ndim ka Ọ nāb͕anwe: le ka O si ewepurum ya nke-uku! ọ bu onye nke nādaghachi azu ka Ọ nēkère ubi nile ayi.


Mb͕e Jisus biara n'ulo onye-isi ahu, hu ndi-ọkwa-ọ̀jà, na ìgwè madu ka ha nātu ùzù,


Ha we bia ulo onye-isi ulo-nzukọ ahu; O we hu ùzù, na ọtutu madu ka ha nākwa ákwá nēti kwa nkpu nke-uku.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan