Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Jeremaya 8:3 - Bible Nso

3 Ha gārọputa kwa ọnwu kari ndu, bú ndi nile fọduru, ndi fọduru site n'ab͕uru ọjọ a, ndi fọduru n'ebe nile M'chusaworo ha, ọ bu ihe si n'ọnu Jehova nke ndi-agha puta.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

3 Nʼebe niile nke m chụsara ha, bụ ndị fọdụrụ ndụ site na mba ọjọọ a, ha ga-ahọrọ ọnwụ karịa ịdị ndụ. Otu a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwubiri.’

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Jeremaya 8:3
22 Iomraidhean Croise  

Ma ya onwe-ya jere ije otù ubọchi n'ọzara, bia nọdu n'okpuru otù osisi broom: ọ riọ Chineke ndu-ya ka ọ nwua, si, O zuwo; ub͕u a, Jehova, wepu ndum; n'ihi na mu onwem adighi nma kari nnam-hà.


Mu onwem gāchikọta kwa ìgwè ewu na aturu nkem fọduru site n'ala nile ebe M'chusaworo ha, M'gēme kwa ka ha lata n'ebe-ita-nri-ha; ha gāmu kwa ọmùmù, ba uba.


kama ha gāsi, Jehova nādi ndu, bú Onye mere ka nkpuru ulo Israel si n'ala Ugwu na n'ala nile ebe M'chusara ha-ri rigoputa, bata; ha gēbi kwa n'elu ala nke aka ha.


M'gēkwe kwa ka unu chọtam, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta), M'gēme kwa ka ndi-unu adọtara n'agha lata, M'gēsi kwa na mba nile, na n'ebe nile M'chugaworo unu, chikọta unu, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta); M'gēme kwa ka unu lata n'ebe ahu nke M'mere ka unu si n'ebe ahu je biri n'ala ọzọ.


n'ihi na o ziteworo ayi ozi na Babilon, si, Mb͕e unu gēbi n'ala ọzọ di anya: wuenu ulo, biri; kuanu ihe n'ubi ab͕ara ogige, rie nkpuru-ha?


ndi-Ju nile we si n'ebe nile achugara ha-ri lata, we bata n'ala Juda, biakute Gedalaia, rue Mizpa, we chikọta manya-vine na nkpuru nke mb͕e nghọkọta-nkpuru nke-uku.


Otú a ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha, bú Chineke nke Israel, siri: Unu onwe-unu ahuwo ihe ọjọ ahu nile nke M'meworo ka ọ biakwasi Jerusalem, biakwasi kwa obodo nile nke Juda; ma, le, ha bu nkpọnkpọ ebe ta, ọ dighi kwa onye bi nime ha;


Ewe wusi ọnumam na iwem, o we re ọku n'obodo nile nke Juda, na n'èzí nile nke Jerusalem; ha we ghọ nkpọnkpọ ebe, ebe tọb͕ọrọ n'efu, dika o si di ta.


Otú a ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha siri, Ha gātutukọsi ndi Israel fọduru dika esi atutukọ nkpuru-vine fọduru: seghachi aka-gi dika ọghọ-nkpuru-vine n'elu alaka nile.


Onye-nwe-ayi, Gi ka ezi omume diri, ma ayi ka ihere iru diri, dika o si di ta; ọ diri ndi Juda, di-kwa-ra ndi bi na Jerusalem, di-kwa-ra Israel nile, ma ndi nọ nso, ma ndi nọ n'ebe di anya, n'ala nile ebe I chugaworo ha, n'ihi nmekpu-ha nke ha mekpuru Gi.


Unu ka M'gēfesa kwa n'etiti mba nile, M'gāmipu kwa mma-agha chua unu n'azu: ala-unu gābu kwa ebe tọb͕ọrọ n'efu, obodo-unu nile gābu kwa nkpọnkpọ ebe.


Nurunu okwu a nke Jehova kwuworo megide unu, umu Israel, megide ab͕uru ahu nile nke M'mere ka ha si n'ala Ijipt rigoputa, si,


Ma ub͕u a, Jehova, biko, wepu ndum n'arum; n'ihi na ọ kam nma inwu ọnwu kari idi ndu.


N'ihi nka ka Jehova siri otú a: Le, M'nēchè èchìchè ihe ọjọ megide ab͕uru nka, bú ihe ọjọ nke unu nāgaghi-ekopu olu-unu, unu agaghi-ejeghari kwa n'idi-elu; n'ihi na mb͕e ọjọ ka ọ bu.


Ọ gēru kwa, mb͕e ihe ndia nile gābiakwasi gi, bú ngọzi ahu na nkọcha ahu nke m'tiyeworo n'iru gi, mb͕e i gēme kwa ka ha biaghachi n'obi-gi n'etiti mba nile, ebe Jehova, bú Chineke-gi, nupuworo gi,


Ọ buru na onye nke gi enupuru enupu anọ na nsọtu elu-igwe, n'ebe ahu ka Jehova, bú Chineke-gi, gāchikọputa gi, n'ebe ahu ka Ọ gēweputa kwa gi.


ha nāsi kwa ugwu na oké nkume ahu, Dakwasinu ayi, zopu ayi n'iru Onye ahu Nke nānọkwasi n'oche-eze ahu, zopu kwa ayi n'iwe nke Nwa-aturu ahu:


N'ubọchi ahu madu gāchọ kwa ọnwu, ha agaghi-ahu kwa ya ma-ọli; agu inwu ọnwu gāgu kwa ha, ọnwu we b͕anari ha.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan