Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Jeremaya 8:16 - Bible Nso

16 Site na Dan ka anuru ima-imi nke inyinya-ya nile: site n'olu ọbube nile nke inyinya-ya nile di ike ala nka nile amawo jijiji; ha we bia richapu ala na ùjú-ya; obodo na ndi bi nime ya.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

16 E sitere na Dan nụ ụda ịma imi ịnyịnya ndị iro. Ala a niile mara jijiji mgbe ha nụrụ akwa nke ịnyịnya ndị ahụ dị ike. Ha na-abịa ịla ala a na ihe niile dị nʼime ya nʼiyi. Ọ bụkwa otu ihe ahụ ka ha na-abịa ime obodo a na ndị bi nʼime ya.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Jeremaya 8:16
22 Iomraidhean Croise  

Ì nēme ya ka ọ kwua ǹtù dika igurube? Ebube nke imapu-imi-ya di oké ujọ.


Jehova nwe uwa na ùjú-ya; Elu-uwa dum madu bi na ndi bi nime ya.


Wukwasi mba nile ọzọ ọnuma-Gi, bú ndi nāmaghi Gi, wukwasi kwa ab͕uru nile ndi nākpọkughi aha-Gi: n'ihi na ha eripiawo Jekob, e, ha eripiawo ya, me ka ọ gwusia, ha emewo kwa ka ebe-obibi-ya tọb͕ọrọ n'efu.


Ma ihe-ihere ahu erichapuwo ihe putara na ndọb͕u nna-ayi-hà dọb͕uru onwe-ha n'ọlu site na mb͕e ayi di na nwata; ìgwè ewu na aturu-ha na ìgwè ehi-ha, na umu-ha ndikom na umu-ha ndinyom.


N'ihi nka agēripia ndi nile nēripia gi; ọzọ, ndi nile ndi nākpab͕u gi, ha nile, na ndọta-n'agha ka ha gāla; ndi nāpunara gi ihe gāghọ ihe apunaraworo n'aka madu, ọ bu kwa ndi nile nke nāluta ihe-gi n'agha ka M'gēnye ka ha ghọ ihe-nluta-n'agha.


N'ihi na otú a ka Jehova siri: Olu nke ọma-jijiji ka ayi nuworo; egwu di, ma udo adighi.


Ahurum ugwu, ma, le, ha nāma jijiji, ugwu ntà nile me-kwa-ra nkapatu.


Ọdum esiwo n'alughi-ulù-ya rigo, bú onye nēbibi mba di iche iche; o buliwo ije-ya, o siwo n'ọnọdu-ya puta; ime ka ala-gi ghọ ebe tọb͕ọrọ n'efu; obodo-gi nile gāghọ ebe tọb͕ọrọ n'efu, ghara inwe onye-obibi.


Site n'olu ọzuzọ nke ukwu inyinya-ya nile di ebube, site na nkpọtu ub͕ọ-ala-ya, na ùzù nke wheel-ya nile, ndi bu nna eleghi anya n'azu ilekwasi umu-ha n'ihi aka kudara akuda;


Ha gērichapu kwa owuwe-ihe-ubi-gi, na nri-gi, nke umu-gi ndikom na umu-gi ndinyom nēri: ha gērichapu ìgwè ewu na aturu-gi na ìgwè ehi-gi: ha gērichapu osisi vine gi na osisi fig i: ha gēji mma-agha titu obodo-gi nile ewusiri ike, nke gi onwe-gi nātukwasi ha obi.


Uta na ube ka ha nējide; mba di irè ka ha bu, ha adighi-enwe obi-ebere; olu-ha nēbib͕ọ dika oké osimiri, ọ bu kwa inyinya ka ha nānọkwasi; edoro mba ahu n'usoro, dika onye nēbu agha, imegide gi, ada Babilon.


Ala ahu we nāma jijiji, nāb͕ali kwa: n'ihi na èchìchè nile nke Jehova megide Babilon eguzosiwo ike, ime ka ala Babilon ghọ ebe tọb͕ọrọ n'efu, ghara inwe onye-obibi.


Uta na ube ka ha nējide; mba di irè ka ọ bu, ha adighi-enwe obi-ebere; olu-ha nēbib͕o dika okè osimiri, ọ bu kwa inyinya ka ha nānọkwasi; edoro mba ahu n'usoro, dika onye nēbu agha, imegide gi, ada Zaion.


Ge nti olu utali, na olu nke ùzù wheel; na inyinya nāwuli awuli, na ub͕ọ-ala nāmali amali;


Ugwu nile huru Gi, we nāb͕ali; Okè miri-ozuzo gabigara: Ob͕u-miri mere ka olu-ya da, Chilie aka-ya elu.


n'ihi na uwa bu nke Onye-nwe-ayi, na ùjú-ya.


Ma ọ buru na onye ọ bula asi unu, Achuru ihe a n'àjà, unu erila, n'ihi onye ahu nke gosiri ya, na n'ihi akọ-na-uche:


Ha we kpọ aha obodo ahu Dan, n'aha Dan, bú nna-ha, onye amuru nye Israel: otù ọ di, Laish bu aha obodo ahu na mbu.


Umu Israel nile we puta, ewe kpọkọta nzukọ Israel dika otù nwoke, site na Dan we rue Bia-sheba, ha na ala Gilead, n'ebe Jehova nọ na Mizpa.


Mb͕e ahu ka ukwu inyinya zọsiri ike Site n'iwuli-elu ahu nile, bú iwuli-elu nke ihe nile ya di ike.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan