Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Jeremaya 8:15 - Bible Nso

15 Ayi lere anya udo, ma ọ dighi ezi ihe biara; ayi lere anya mb͕e ọgwugwọ, ma le, oké egwu.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

15 Anyị lere anya udo, ma o nweghị ihe ọma ọbụla anyị hụrụ. Anyị lere anya ọgwụgwọ ọrịa anyị, maọbụ naanị ihe egwu ka anyị hụrụ.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Jeremaya 8:15
9 Iomraidhean Croise  

Mb͕e m'lere anya ezi ihe, ihe ọjọ bia-kwa-ra; M'we chere ìhè, ma ọchichiri biara.


N'elu ebe nile di elu nke ọhia nādighi nke di n'ọzara ka ndi nāpunara madu ihe biaworo: n'ihi na mma-agha Jehova nwere nēripia site n'otù nsọtu nke ala we rue nsọtu ọzọ nke ala: ọ dighi udo anu-aru ọ bula, bú madu, nwere.


Ì jusiwo Juda? ọ̀ bu Zaion ka nkpuru-obi-Gi sọworo oyi? gini mere I ji tib͕u ayi, ma ọ dighi ọgwugwọ diri ayi? Ayi lere anya udo, ma ọ dighi ezi ihe biara; ayi lere anya mb͕e ọgwugwo, ma, le, oké egwu!


M'we si, Ewó, Onye-nwe-ayi Jehova! n'ezie I rafuwo ndi nka na Jerusalem nke-uku, si, Udo gādiri unu, ma mma-agha emetuwo nkpuru-obi aru.


Apula ibà n'ọhia, eje-kwa-la ije n'uzọ; n'ihi na onye-iro nwere mma-agha, ujọ di buruburu.


Ha we gwọ nb͕aji ukwu na aka nke ada ndim nākpọghi ya ihe, si, Udo, udo; mb͕e udo nādighi.


Nkpà abiawo; ha gāchọ kwa udo, ma ọ dighi.


N'ihi na nwanyi bi na Marot echerewo inwe ezi ihe: n'ihi na ihe ọjọ esiwo n'ebe Jehova nọ ridarue ọnu-uzọ-ama Jerusalem.


Mb͕e ha nāsi, Udo na ntukwasi-obi di, mb͕e ahu na mberede ka nbili nābiakwasi ha, dika ime nēme nwanyi nke di ime; ha agaghi-ab͕anari kwa ya ma-ọli.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan