Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Jeremaya 8:14 - Bible Nso

14 N'ìhi gini ka ayi onwe-ayi nānọdu ala? chikọtanu onwe-unu, ka ayi ba n'obodo nile ewusiri ike, we debe ọnu-ayi du n'ebe ahu: n'ihi na Jehova, bù Chineke-ayi, emewo ka ayi debe ọnu-ayi du, O mewo kwa ka ayi ṅua miri ńsí, n'ihi na ayi emehiewo megide Jehova.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

14 Gịnị ka unu na-eme nʼebe a unu nọdụrụ ala? Kwakọtaanụ ihe unu niile. Ngwa, ka anyị gbapụnụ ọsọ gaa nʼobodo ndị ahụ niile e wusiri ike nọdụ nʼebe ahụ nwụọ! Nʼihi na Onyenwe anyị Chineke anyị amaala anyị ikpe ọnwụ. O nyela anyị mmiri e tinyere nsi ka anyị ṅụọ, nʼihi na anyị emehiela megide ya.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Jeremaya 8:14
23 Iomraidhean Croise  

Devid we si Abishai, Ub͕u a Sheba nwa Bikri gēmejọ ayi kari Absalom: gi onwe-gi chiri ndi-orù onye-mwe-gi, chua ya n'azu, ka o we ghara ichọtara onwe-ya obodo ufọdu ewusiri ike, we naputa onwe-ya n'anya-ayi.


Aghọrọm onye-ob͕i n'inọ-dū, ab͕aram nkiti, ọbuná ipu n'ikwu ezi ihe; Ewe kpalie ihe-nb͕um.


Ha we nyem ńsí di ilu ka ọ buru ihe-oririm; Ọzọ mb͕e akpiri kpọrọm nku ha nēme ka m'ṅua manya-vine b͕ara uka.


Nọdu du, ba n'ọchichiri, gi ada ndi Kaldea: n'ihi na i gāghi-abu onye ha nākpọ, Nwanyi-nwe ala-eze di iche iche.


Jehova, ayi mara nmebi-iwu-ayi, na ajọ omume nna-ayi-hà: n'ihi na ayi emehiewo megide Gi.


Ọ bu ezie na ajọ omume-ayi azawo megide ayi, ma Gi lua olu n'ihi aha-Gi, Jehova: n'ihi na ndaghachi-azu-ayi di ọtutu; Gi ka ayi mehieworo megide.


N'ihi nka ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha ji kwue okwu di otú a bayere ndi-amuma ndia, si: Le, M'gaje ime ka ha rie wormwood, M'gēme kwa ka ha ṅua miri ńsí; n'ihi na ndi-amuma nke Jerusalem ka nmeru puworo je rue ala nka nile.


Ka ayi dina ala n'ihere-ayi, ka ọnọdu-ihere etiyere ayi nime ya kpuchi kwa ayi: n'ihi na Jehova, bú Chineke-ayi, ka ayi mehieworo megide, ayi onwe-ayi na nna-ayi-hà, site na mb͕e ayi di na nwata we rue ta: ayi egeghi kwa nti n'olu Jehova, bú Chineke-ayi.


O rue, mb͕e Nebukadreza, bú eze Babilon, rigotara n'ala nka, na ayi siri, Bianu, ka ayi ba na Jerusalem n'ihi usu-ndi-agha nke ndi Kaldea, na n'ihi usu-ndi-agha nke Siria; ayi we biri na Jerusalem.


ma ha ejesowo isi-ike nke obi-ha, jeso kwa Bealim, nke ndi bu nna-ha zíri ha:


n'ihi nka ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha, bú Chineke nke Israel, ji si otú a, Le, M'gaje ime ka ha, bú ndi nka, rie wormwood, M'gēme kwa ka ha ṅua miri ńsí.


Cheta nweda-n'alam na nwagharim, na wormwood na ńsí.


Moses we si Eron, Nka bu ihe Jehova kwuru, si, N'aru ndi nābiarum nso ka agēdom nsọ, ọ bu kwa n'iru ndim nile ka agāsọpurum. Eron we b͕a nkiti.


Ma mb͕e nwa-nne nna madu, bú onye-nsure-ọku-ya, gēburu ya ichipu ọkpukpu n'ulo, si onye nke nọ n'ime-ime-ulo nke ulo ahu, Ọ̀ di onye ọzọ gi na ya nọ? ọ gāsi, É-è; si kwa, Nọdu du; n'ihi na ayi agaghi-ehota aha Jehova.


Ma Jehova nọ n'ulo uku Ya di nsọ: dere du n'iru Ya, gi uwa nile.


Dere du, unu anu-aru nile, n'iru Jehova: n'ihi na O siwo n'ebe-obibi-Ya di nsọ teta.


ha we nye Ya manya-vine nke agwara òlùlù ka Ọ ṅua: ma mb͕e O deturu ya ire, Ọ chọghi ka Ọ ṅua.


ka nwoke, ma-ọbu nwayi, ma-ọbu ab͕uru, ma-ọbu ebo, we ghara idi n'etiti unu, nke obi-ya nēchigharí pua ta n'ebe Jehova, bú Chineke-ayi, nọ, ije ifè chi nile nke mba ahu nile òfùfè; ka nkpọrọgwu nke nāmi ńsí na wormwood we ghara idi n'etiti unu;


N'ihi na ọ bu n'osisi vine nke Sọdọm ka osisi vine ha sitere, Site kwa n'ubi Gọmọra: Nkpuru-vine-ha bu nkpuru-vine ńsí, Uyọkọ di ilu ka ha nwere:


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan