Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Jeremaya 7:8 - Bible Nso

8 Le, unu onwe-unu nātukwasi obi-unu n'okwu-ugha nile, o we ghara ibara unu urù.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

8 Ma lee, ihe unu na-eme ugbu a bụ ịtụkwasị uche unu nʼokwu aghụghọ nke na-enweghị isi.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Jeremaya 7:8
14 Iomraidhean Croise  

N'ihi na unu asiwo, Ayi na ọnwu ab͕awo ndu, ayi na ala-mọ ekweritawo kwa nkwa; mb͕e utari nke nērubiga ókè dika miri gāgabiga, ọ gaghi-abiakute ayi; n'ihi na ayi emewo ka okwu-ugha buru ebe-nb͕abà-ayi, ọ bu kwa n'okwu-ugha ka ayi zobeworo onwe-ayi:


ndi siworo ndi-ọhu-uzọ, Unu agaghi-ahu uzọ; ndi siwo-kwa-ra ndi-ọhù, Unu agaghi-ahuru ayi ihe ziri ezi n'ọhù-unu, gwanu ayi okwu ire-utọ nile, hunu ihe-ikwa-emò n'ọhù-unu:


Ọ dighi onye nākpọ madu eje ikpé n'ezi omume, ọ dighi kwa onye nēji ikwesi-ntukwasi-obi eje ikpé: ha nātukwasi obi n'ihe tọb͕ọrọ n'efu, ha nēkwu kwa okwu-ugha; ha nāturu ime ọnọdu ọjọ, mua ajọ ihe.


Nka bu ihe efetara gi na nzà, òkè nke atùworo nye gi site nam, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta); n'ihi na i chezọwo Mu onwem, we tukwasi okwu-ugha obi-gi.


Rùe ole mb͕e ka nka gādi n'obi ndi-amuma ndi nēbu amuma ugha; bú ndi-amuma nke nēbu amuma aghughọ nke obi-ha?


Le, Mu nēmegide ndi nēbu amuma nrọ ugha, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta), ha we ze ha, me ka ndim kpafue site n'okwu-ugha nile ha na n'obi-ha nādighi n'otù ebe: ma Mu onwem eziteghi ha, enyeghkwam ha iwu; ọ dighi kwa urù ha gābara ndi nka ma-ọli; ọ bu ihe si n'onu Jehova puta.


Jeremaia, bú onye-amuma, we si Hananaia, bú onye-amuma, Biko, nuru, Hananaia; Jehova eziteghi gi; ma gi onwe-gi emewo ka ndi nka tukwasi okwu-ugha obi.


M'we si, Ewó, Onye-nwe-ayi Jehova! n'ezie I rafuwo ndi nka na Jerusalem nke-uku, si, Udo gādiri unu, ma mma-agha emetuwo nkpuru-obi aru.


ndi-amuma ebuwo amuma ugha, ndi-nchu-àjà nāzọda kwa ndim site n'aka-ha; ndim ahuwo kwa ihe di otú a n'anya: ma gini ka unu gēme n'ikpe-azu-ya?


Unu atukwasila obi-unu n'okwu-ugha nile, si, Ulo uku Jehova, ulo uku Jehova, ulo uku Jehova, ka ndi a bu.


N'ihi nka ka M'gāchiri nwunye-ha nye ndi ọzọ, were kwa ubi nile ha nye ndi gēnweta ha: n'ihi na site n'onye dikarisiri ntà we rue onye dikarisiri uku onye ọ bula bu onye akpiri urù nēzighi ezi nākpọ nku, site n'onye-amuma we rue onye-nchu-àjà onye ọ bula nēme ihe n'ugha.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan