Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Jeremaya 7:30 - Bible Nso

30 N'ihi na umu Juda emewo ihe jọrọ njọ n'anyam; ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta: ha edowo ihe-árú nile ha n'ulo ahu nke akpọkwasiri aham, imeru ya.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

30 “ ‘Onyenwe anyị kwupụtara sị, ndị Juda emeela ihe ọjọọ dị iche iche nʼihu m. Ha akpụọla arụsị rụrụ arụ nke ha tinyere nʼime ụlọnsọ ukwu ahụ a kpọkwasịrị aha m. Ha emerụọla ya.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Jeremaya 7:30
20 Iomraidhean Croise  

Ebe di elu nke Hezekaia nna-ya mere ka ha la n'iyì, o wue ha ọzọ; o guzo-kwa-ra ebe-ichu-àjà nye Beal, me kwa Ashera, dika Ehab, bú eze Israel, mere, ọ kpọ isi ala nye usu nile nke ihe elu-igwe, fè ha òfùfè.


O wu-kwa-ra ebe-ichu-àjà di iche n'ulo Jehova, nke Jehova siri, Nime Jerusalem ka M'gētiye aham.


Ọ dọba-kwa-ra arusi apiri api nke Ashera, bú nke o mere, n'ulo ahu nke Jehova siri Devid, si kwa Solomon nwa-ya, N'ulo a, na nime Jerusalem, nke M'rọputaworo n'ebo nile nke Israel, ka M'gētiye aham rue mb͕e ebighi-ebi:


Ebe-ichu-àjà nile nke di n'elu ime-ulo-elu nke Ehaz, nke ndi-eze Juda mere, na ebe-ichu-àjà nile nke Manase mere n'ogige abua nke ulo Jehova, eze kwaturu ha, we si n'ebe ahu b͕a ọsọ, kpofue uzuzu-ha nime miri-iyi Kidron.


O wezuga-kwa-ra chi nile nke ala ọzọ, si kwa n'ulo Jehova wezuga oyiyi-ihe ahu, ya na ebe-ichu-àjà nile nke o wuru n'ugwu ulo Jehova, na nime Jerusalem, o kpofue ha n'azu obodo.


Ebe di elu nke Hezekaia nna-ya kwaturu, o wue ha ọzọ; o guzo-kwa-ra ebe-ichu-àjà nye Bealim, me kwa Asherot, kpọ kwa isi ala nye usu nile nke ihe elu-igwe, fè ha òfùfè.


Ọ dọba-kwa-ra arusi apiri api nke oyiyi-ihe ahu, bú nke o mere, n'ulo Chineke, bú nke Chineke siri Devid, si kwa Solomon nwa-ya, Ṅ'ulo a, na nime Jerusalem, nke M'rọputaworo n'ebo nile nke Israel, ka M'gētiye aham rue mb͕e ebighi-ebi:


Mu onwem gārọputa kwa ichì-ọchì nile ha, me kwa ka ihe-ujọ nile ha biakwasi ha; n'ihi na M'kpọrọ òkù, ma ọ dighi onye nāza; ekwurum okwu, ma ha anugh: ha we me ihe jọrọ njọ n'anyam, ọ bu kwa ihe ahu nke nātọghm utọ ka ha rọputara.


Ma M'gēburu uzọ kwughachi ajọ omume-ha na nmehie-ha okpukpu abua; n'ihi na ha emewo alam ka ọ ghara idi nsọ n'ozu nke nile ha nke nāsọ oyi, ọ bu kwa ihe-árú nile ha ka ha ji kpojue ihe-nketam.


N'ihi na emeruwo ma onye-amuma ma onye-nchu-àjà; e, n'ulom ka M'chọputaworo ihe ọjọ ha; ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta.


Ha we do ihe-árú nile ha n'ulo ahu nke akpọkwasiri aham, imeru ya.


Ha we wue ebe nile di elu nke Beal, nke di na ndagwurugwu nwa Hinom, ime ka umu-ha ndikom na umu-ha ndinyom si n'ọku gabigarue Molek; bú ihe nke M'nēnyeghi ha n'iwu, ọ bataghi kwa n'obim, ka ha we me ihe-árú a; ime ka Juda mehie.


Ma ima-nma nke ihe-ichọ-nma-ya, na nbili-elu ka o doro ya: ma onyinyo di iche iche nke ihe-árú nile ha na nke ihe nile ha nke jọb͕uru onwe-ha ka ha mere nime ya: n'ihi nka ka M'meworo ya ka ọ ghọrọ ha ihe-isọ-nsọ.


O we setipu udi aka madu, jidem n'agiri-isi nke isim; Mọ Chineke we buliem elu n'etiti ala na elu-igwe, me ka m'bata Jerusalem n'ọhù nke Chineke, rue oghere nke ọnu-uzọ-ama nke ogige di nime nke nēche Ugwu iru; ebe ọnọdu ihe-oyiyi nke ekworo di, bú nke nākpasu ekworo.


Ogwe-aka ufọdu gēsite kwa n'akuku-ya guzo, me ka ebe nsọ ahu ghara idi nsọ, bú ebe ahu siri ike, ha gēwezuga kwa àjà-nsure-ọku ahu anēsure mb͕e dum, ha gēdo kwa ihe-árú nke nākpata itọb͕ọrọ-n'efu.


Ọ gēme kwa ka otù ọb͕ub͕a-ndu siere ọtutu madu ike otù ízù: ọ bu kwa na nkera ízù ahu ka ọ gēme ka àjà na onyinye-inata-iru-ọma kwusi; ọ bu kwa n'elu nkù ihe-árú di iche iche ka otù onye nke nākpata itọb͕ọrọ-n'efu gābia: ọ bu kwa rue mb͕e agāwukwasi ngwusi na ihe akara àkà n'aru onye ahu nākpata itọb͕ọrọ-n'efu.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan