Jeremaya 7:23 - Bible Nso23 kama ọ bu okwu a ka M'nyere ha n'iwu, si, Genu nti olum, M'gābu-kwa-ra unu Chineke, unu onwe-unu gābu-kwa-ram otù ndi: je-kwa-nu ije n'uzọ nile nke M'nēnye unu n'iwu, ka o we diri unu nma. Faic an caibideilBaịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a23 Ma iwu m nyere ha bụ nke a, ruberenụ m isi, aga m abụ Chineke unu, unu ga-abụkwa ndị nke m. Bienụ ndụ nʼiwu niile m nyere unu, ka ihe gaara unu nke ọma. Faic an caibideil |
si, Ọ buru na i ge nti nke-ọma n'olu Jehova, bú Chineke-gi, ọ buru kwa na i me ihe nke ziri ezi n'anya-Ya, ọ buru kwa na i ṅa nti n'ihe Ọ nyere n'iwu, ọ buru kwa na i debe ukpuru-Ya nile, ọ dighi ọria ọ bula nke M'tiyere n'aru ndi Ijipt M'gētiye n'aru gi: n'ihi na Mu onwem bu Jehova Nke nēme ka aru di gi nma.
Ma agēme ka onye-amuma ahu, ma-ọbu ọrọ-nrọ ahu, nwua; n'ihi na o kwuworo okwu nwezuga megide Jehova, bú Chineke-unu, (Onye nēme ka unu si n'ala Ijipt puta, Onye nāb͕aputa kwa gi n'ulo ndi-orù), ka o we duhie gi n'uzọ ahu nke Jehova, bú Chineke-gi, nyere gi n'iwu ije ije nime ya. I we kpochapu ihe ọjọ ahu n'etiti gi.