Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Jeremaya 7:16 - Bible Nso

16 Ma gi onwe-gi, ekpela ekpere bayere ndi nka, ebuli-kwa-la iti-nkpu na ikpe-ekpere bayere ha, ariọ-kwa-lam aririọ: n'ihi na M'gaghi-anānu olu-gi.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

16 “Ya mere, unu ekperela m ekpere nʼihi ndị a; unu atụfula oge unu ịrịọ m arịrịọ nʼihi ha. Agaghị m ege ntị nʼekpere na arịrịọ unu.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Jeremaya 7:16
14 Iomraidhean Croise  

Benaia nwa Jehoiada bu onye-isi ndi Keret na ndi Pelet; umu-ndikom Devid bu ndi-isi n'ije ozi.


ma ub͕u a kwe ka M'nọduru Onwem, ka iwem we di ọku megide ha, ka M'we me kwa ka ha gwusia; M'gēme kwa gi ka i buru mba uku.


Ọzọ, mb͕e unu nāb͕asa ọbu-aka-unu abua, M'gēzonari unu anyam abua: ọbuná mb͕e unu nēkpe ọtutu ekpere, M'gaghi-adi nānu: aka-unu juputara n'ọbara.


Ma gi onwe-gi, ekpela ekpere bayere ndi nka, ebuli-kwa-la iti-nkpu na ikpe-ekpere bayere ha: n'ihi na M'gaghi-nānu olu-ha na mb͕e ha nākpokum n'ihi ihe ọjọ ha.


Jehova we sim, Ọ buru na Moses na Samuel eguzo n'irum, nkpuru-obim agaghi-adi n'ebe ndi nka nọ: chupu ha n'irum, ka ha pu kwa.


Gi onwe-gi arapuwo Mu onwem, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta), azu ka i nālaghachi: M'we setipu akam imegide gi, we bibie gi; ike ncheghari agwusiwom.


Àgākwughachi ihe ọjọ n'ọnọdu ezi ihe? n'ihi na ha egwuworo nkpuru-obim olùlù. Cheta nguzo m'guzoro n'iru Gi ikwu ezi ihe bayere ha, ime ka ọnuma-Gi si n'aru ha laghachi.


N'ihi nka ka uwa gēru újú, elu-igwe nke di n'elu gēji kwa nji: n'ihi na ekwubewom, ezubewom, echègharighkwam, M'gaghi-esi kwa nime ya laghachi azu.


Ì dighi-ahu ihe ndi ahu nēme n'obodo nile nke Juda na n'èzí nile nke Jerusalem?


Mb͕e ahu ka ha gētiku Jehova nkpu, ma Ọ gaghi-aza ha: Ọ gēzonari kwa ha iru-Ya na mb͕e ahu, dika ha meworo ka omume nile ha jọ njọ.


ram aka, ka M'we kpochapu ha, hichapu kwa aha-ha n'okpuru elu-igwe: M'gēme kwa gi ka i buru mba di ike ba kwa uba kari ha.


Ọ buru na onye ọ bula ahú nwa-nna-ya ka ọ nēmehie nmehie nke nādighi-eweta ọnwu, ọ gāriọ aririọ, Chineke gēnye kwa ya ndu inye ndi nēmehie nmehie ahu nke nādighi-eweta ọnwu. Nmehie di nke nēweta ọnwu: ọ bughi ekpere bayere nka ka m'nāgwa ya ka o kpe.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan