Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Jeremaya 6:4 - Bible Nso

4 Donu agha nsọ imegide ya; bilienu, ka ayi rigo n'etiti-ehihie. Ahuhu diri ayi! n'ihi na chi eruruwo, n'ihi na onyinyo anyasi nēsetipu onwe-ha.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

4 “Jikerenụ ibu agha megide ya! Bilienụ, ka anyị buso ha agha nʼehihie. Ma lee, anyanwụ ebidola ịda, onyinyo anyasị na-esetipụkwa onwe ya.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Jeremaya 6:4
14 Iomraidhean Croise  

Dika orù si ekusie ume ike ibà n'okpuru ǹdò, Na dika onye egoro ọlu si ele anya ugwọ-olu-ya:


Rue mb͕e ifufe anyasi nēfe n'ubọchi, mb͕e onyinyo nile nāb͕alaga kwa, Chigharia, gi onye ihe-gi nātọm utọ, me onwe-gi ka i yie mb͕ada ma-ọbu nwa-ele N'elu ugwu nile nke Beta.


Ndinyom-ha di-ha nwuru ababigaworom uba ókè kari ájá nke oké osimiri nile: emewom ka onye nke nāpunara madu ihe biakute ha n'etiti-ehihie imegide nne nke umu-okorọbia: emewom ka nhuju-anya na obi-ọlulọ-miri dakwasi ya na mberede.


Nwayi nke muworo umu asa atalatawo; o kubìwo ume; anyanwu-ya adawo mb͕e ubọchi fọduru; ihere emewo ya, o we nwe iru-ihere: ọzọ, ndi-ha fọduru, ọ bu n'aka mma-agha ka M'gēnye ha n'iru ndi-iro-ha; ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta.


Rigonu n'elu mb͕idi-ya nile, bibie; ma unu emela ka ọ gwusia: wezuganu alaka-ya nile: n'ihi na ọ bughi ihe Jehova nwere ka ha bu.


Uta na ube ka ha nējide; mba di irè ka ọ bu, ha adighi-enwe obi-ebere; olu-ha nēbib͕o dika okè osimiri, ọ bu kwa inyinya ka ha nānọkwasi; edoro mba ahu n'usoro, dika onye nēbu agha, imegide gi, ada Zaion.


Owuwe-ihe-ubi agabigawo, nghọkọta-nkpuru agwusiwo, ma ayi onwe-ayi, azọputaghi ayi.


Kpọsanu nka n'etiti mba nile; donu agha nsọ: kpọtenu ndi-dike; ka ndi-agha nile biarue nso, rigota.


Ọhù Obadaia. Otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri bayere Edom: Ayi anuwo ihe-ọnunu sitere n'ọnu Jehova, ezigawo kwa ukọ̀ n'etiti mba nile, si, Bilienu, ka ayi bilie imegide ya n'agha.


Okwu di otú a ka Jehova kwuru bayere ndi-amuma ahu ndi nēdufu ndim; ndi ji ezé-ha ata aru, we kpọ, si, Udo; ma onye ọ bula nke nādighi-etiye ihe n'ọnu-ha, ha ewe do agha nsọ megide ya;


N'ihi na Geza gābu ebe arapuru arapu, Ashkelon gāghọ kwa ebe tọb͕ọrọ n'efu: Ashdod, n'etiti-ehihie ka agāchupu ya, agēropu kwa Ekron.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan