Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Jeremaya 6:25 - Bible Nso

25 Apula ibà n'ọhia, eje-kwa-la ije n'uzọ; n'ihi na onye-iro nwere mma-agha, ujọ di buruburu.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

25 Ka onye ọbụla gharakwa ịga nʼubi, maọbụ ijegharị nʼokporoụzọ, nʼihi na ndị iro ji mma agha na-agagharị, egwu dịkwa nʼebe niile.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Jeremaya 6:25
20 Iomraidhean Croise  

Ma na mb͕e ahu ọ dighi udo diri onye nāpu apu, ma-ọbu diri onye nābata abata, kama ọtutu ib͕a-aghara dikwasiri ndi nile bi n'ala ahu nile.


Ihe-egwu emewo ka ọ tua egwu nke-uku buruburu, Ha we chugharia ya n'ukwu-ya.


N'ihi na anuwom akukọ ọjọ nke ọtutu madu, Ujọ dim buruburu: Mb͕e ha nāb͕a ìzù n'otù imegidem, Ha zubere iwepu ndum.


ma ọ buru na unu aju, we nupu isi, mma-agha gērichapu unu: n'ihi na ọnu Jehova ekwuwo.


Ọ buru na apuam je n'ọhia, le, ndi ejiworo mma-agha b͕u! ma ọ buru na abàm n'obodo a, le, ndi nāria ọria site n'oké unwu! n'ihi na ma onye-amuma ma onye-nchu-àjà, ha akpaghariwo n'ala, ma ha amaghi ihe.


N'ihi na anuwom akukọ ọjọ nke ọtutu madu, ujọ dim buruburu. Gosinu, ayi gēgosi kwa ya, ka ha nāsi, bú ndi nile mu na ha di n'udo, ndi nēche nche n'akukum; eleghi anya agāràra ya, ayi ewe nwe ike imegide ya, bọ̀ọ ọ́bọ̀-ayi n'aru ya.


N'ihi na otú a ka Jehova siri: Olu nke ọma-jijiji ka ayi nuworo; egwu di, ma udo adighi.


M'we si, Ewó, Onye-nwe-ayi Jehova! n'ezie I rafuwo ndi nka na Jerusalem nke-uku, si, Udo gādiri unu, ma mma-agha emetuwo nkpuru-obi aru.


Gosinu na Juda, me-kwa-nu ka anuru ya na Jerusalem; si-kwa-nu, Fùanu opì-ike n'ala nka: kpọzuenu nkpu, si, Chikọtanu onwe-unu, ka ayi ba kwa n'obodo nile ewusiri ike.


Gini mere m'huworo ya? ndi ahu nātu ujọ b͕aghachi azu; anētipia kwa ndi-dike-ya, ha ab͕alagawo kwa ngwa ngwa, we ghara ile anya n'azu: egwu di buruburu; ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta.


Ulo-ikwū nile ha na ìgwè ewu na aturu-ha ka ha gāchiri; ákwà-nkwuba nile ha na ihe nile ha na camel nile ha ka ha gēbupuru onwe-ha: ha gākpọ nkpu bayere ha, si, Ujọ di buruburu.


Le, M'gaje ime ka oké egwu biakwasi gi, (ọ bu ihe si n'ọnu Onye-nwe-ayi, bú Jehova nke usu nile nke ndi-agha, puta), site na ndi nile nọ gi buruburu; agāchupu kwa unu, onye ọ bula n'iru ya, ọ gaghi-adi kwa onye nāchikọta onye ọ bula nāwaghari.


N'ìhi gini ka ayi onwe-ayi nānọdu ala? chikọtanu onwe-unu, ka ayi ba n'obodo nile ewusiri ike, we debe ọnu-ayi du n'ebe ahu: n'ihi na Jehova, bù Chineke-ayi, emewo ka ayi debe ọnu-ayi du, O mewo kwa ka ayi ṅua miri ńsí, n'ihi na ayi emehiewo megide Jehova.


Ayi lere anya udo, ma ọ dighi ezi ihe biara; ayi lere anya mb͕e ọgwugwọ, ma le, oké egwu.


I nākpọ, dika n'ubọchi nke mb͕e akara àkà, ujọm nile di buruburu, Ọ dighi kwa onye b͕apuru ab͕apu ma-ọbu onye fọduru afọdu n'ubọchi nke iwe Jehova: Umum ndi m'tughariworo n'aka zulite, onye-irom emewo ka ha gwusia.


Ọzọ, Mu onwem gākukọta kwa ọbu-akam abua, M'gēme kwa ka ọnumam zuru ike: Mu onwem, bú Jehova, ekwuwo.


Ha gēke kwa ákwà-nkpe n'úkwù-ha, oké ọma-jijiji gēkpuchi kwa ha; ọ bu kwa iru nile ka ihere gēme, n'isi nile ha ka nkwọcha-isi gādi kwa.


N'ihi na ubọchi gābiakwasi gi, mb͕e ndi-iro-gi gēgwu ékpè na ìgá imegide gi, nọgide kwa gi gburugburu, jigide kwa gi n'akuku nile,


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan