N'ihi na olu dika nke nwanyi ime nēme ka m'nuworo, ihe-nb͕u dika nwanyi nāmu nwa mbu ya, bú olu nke ada Zaion, o nēku ike ike, ọ nāb͕asa ọbu-aka-ya abua, si, Ahuhu dirim nọ̄! n'ihi na nkpuru-obim nāda #mbà n'iru ndi-ob͕u-madu.
Le, ka Onye-nwe-ayi si were igwe-oji kpuchie ada Zaion n'iwe-Ya! O siwo n'elu-igwe tuda ima-nma nke Israel n'ala, Ọ chetaghi kwa ihe-nb͕akwasi-ukwu-Ya n'ubọchi iwe-Ya.
Gini, bu àmà M'gāb͕ara gi? gini ka M'gēji tuyere gi, gi ada Jerusalem? Gini ka M'gēme ka gi na ya rata, ka M'we kasie gi obi, gi ada Zaion nāmaghi nwoke? N'ihi na ihe di uku dika oké osimiri ka nb͕awa-gi bu: ònye gāgwọta gi?
Nwanyi nke di nro n'etiti gi, nke di kwa pekepeke, nke nādighi-anwa iguzo ọbu-ukwu-ya n'ala n'ihi idi-pekepeke na n'ihi idi-nro, anya-ya gājọ njọ n'aru di nke obi-ya, na n'aru nwa-ya nwoke, na n'aru nwa-ya nwayi;