Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Jeremaya 52:7 - Bible Nso

7 Ewe tipue obodo, ndi-agha nile we b͕apu, pua n'obodo n'abali n'uzọ ọnu-uzọ-ama n'etiti mb͕idi-ya abua, nke di n'akuku ubi eze ab͕ara ogige; (ma ndi Kaldea nānọ imegide obodo buruburu:) ha we je n'uzọ Araba.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

7 Mgbe ahụ, e tipuru oghere nʼaja mgbidi obodo ahụ, ndị agha niile ji abalị gbapụ site nʼọnụ ụzọ ama nke dị nʼetiti mgbidi abụọ nʼakụkụ ubi eze a gbara ogige, nʼagbanyeghị na ndị Babilọn nọ obodo ahụ gburugburu. Ha gbapụrụ chee ihu nʼụzọ Araba.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Jeremaya 52:7
17 Iomraidhean Croise  

Ewe tipue obodo, ndikom agha nile we b͕apu n'abali n'uzọ ọnu-uzọ-ama n'etiti mb͕idi-ya abua, nke di n'akuku ubi eze ab͕ara ogige: (ma ndi Kaldea nānọ imegide obodo buruburu:) eze we je n'uzọ Araba.


Le, M'gaje inye iwu, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta), me ka ha biaghachi n'obodo a; ha gēbuso kwa ya agha, were ya, sure ya n'ọku: ọ bu kwa obodo nile nke Juda ka M'gēme ka ha ghọ ebe tọb͕ọrọ n'efu, ghara inwe onye-obibi.


n'arọ nke-iri-na-otù nke Zedekaia, n'ọnwa nke-anọ, n'ubọchi nke-iteghete nke ọnwa ahu, ka awapuru n'obodo ahu:)


N'ihi nka ka umu-okorọbia-ya gāda n'amá-ya nile, ọ bu kwa ndi-agha-ya nile ka agēme ka ha dere du n'ubọchi ahu; ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta.


ọ bu kwa ngabiga-miri nile ka ewereworo, ọ bu kwa ọdọ-miri nile ka ha sureworo ọku, ndi-agha amawo kwa jijiji.


Bilienu, ka ayi rigo n'abali, ka ayi bibie ulo-elu-ya nile.


Onye-isi ahu kwa nke nọ n'etiti ha, n'ubu-ya ka o gēbu ihe n'ọchichiri, we pua: mb͕idi ka ha gēgwupú isi na ya bupu ihe: iru-ya ka o gēkpuchi, n'ihi na ya onwe-ya agaghi-eji anya-ya hu ala ahu.


I gēbuputa kwa ihe-gi nile n'ehihie n'anya-ha, dika ihe nke ndi anēme ka ha je biri n'ala ọzọ: gi onwe-gi gāpu kwa n'anyasi n'anya-ha, dika ọpupu nke ndi anēme ka ha je biri n'ala ọzọ.


O rue, n'arọ nke-iri-na-abua nke emere ka ayi je biri n'ala ọzọ, n'ọnwa nke-iri, n'ubọchi nke-ise nke ọnwa ahu, na otù onye nke siri na Jerusalem b͕apu biakuterem, si, Etikpọwo obodo-ayi.


M'gēche irum imegide unu, agētib͕u kwa unu n'iru ndi-iro-unu: ndi nākpọ unu asì gāzọda unu; unu gāb͕alaga kwa mb͕e ọ nādighi onye nāchu unu.


Ma ndi nāfọdu n'etiti unu, M'gēme ka ida-mbà ba n'obi-ha n'ala ndi-iro-ha: olu nke akwukwọ-osisi ifufe nēfepu gāchu kwa ha; ha gāb͕alaga nb͕alaga mma-agha; ha gāda kwa mb͕e ọ dighi onye nāchu ha.


Ọ bu kwa ntipú-mb͕idi di iche iche ka unu gēsi pua, nwanyi ọ bula na ncherita-iru ya; unu gātubà onwe-unu na Hamon; ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta.


Jehova gēme ka etib͕ue gi n'iru ndi-iro-gi: n'otù uzọ ka i gāpukuru ha, ma n'uzọ asa ka i gāb͕alaga n'iru ha: i gāghọ-kwa-ra ala-eze nile nke uwa ihe-ntughari.


Òtù onye gēsi aṅa chu nnù madu abua na ọgu iri, Màdu abua gēsi kwa aṅa me ka orú nnù madu na nnù madu ise b͕alaga, Ma ọ buru na Oké Nkume-ha ereghi ha, Ọ buru kwa na Jehova emechibidoghi ha uzọ?


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan