Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Jeremaya 51:62 - Bible Nso

62 si, Jehova, Gi onwe-gi ekwuwo okwu bayere ebe a ibipu ya, ka ihe ọ bula we ghara ibi nime ya, ma ọ bu madu ma-ọbu anumanu, n'ihi na ebe tọb͕ọrọ n'efu mb͕e ebighi-ebi ka ọ gābu.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

62 Emesịa, ị ga-ekwukwa sị, ‘Onyenwe anyị, gị onwe gị ekwuola na i ga-ebibi ebe a, ma mmadụ maọbụ anụmanụ agaghị ebikwa nʼime ya. I kwuokwala na ọ ga-aghọ mkpọmkpọ ebe ruo mgbe ebighị ebi.’

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Jeremaya 51:62
16 Iomraidhean Croise  

O gēru kwa, mb͕e ọgu arọ na iri ruzuru, na M'gēwere ajọ omume ha leta eze Babilon, leta kwa mba ahu, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta), leta kwa ala Kaldea; M'gēme kwa ya ka ọ ghọ ebe tọb͕ọrọ n'efu mb͕e ebighi-ebi.


le, M'gaje iziga chiri ab͕uru nile nke Ugwu, (ọ̀ bu ihe si n'ọnu Jehova puta), ọ bu kwa Nebukadreza, bú eze Babilon, bú orùm, ka M'gēzigara ozi, M'gēme kwa ka ha bia imegide ala nka, na imegide ndi bi ya, na imegide mba nile ndia nọ ya buruburu; M'gēwezuga kwa ha ka ebibie ha, M'gēme kwa ha ka ha ghọ ihe-iju-anya, na ihe-ima-ọsọ, na nkpọnkpọ ebe di mb͕e ebighi-ebi.


Otú a ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha siri: N'ebe a, nke bu nkpọnkpọ ebe, nke ọ nādighi madu ma-ọbu anumanu nēbi nime ya, na n'obodo-ya nile, ka ebe-obibi nke ndi-ọzùzù-aturu ndi nēme ka ìgwè ewu na aturu-ha makpu gādi kwa ọzọ.


ihere gēme nne-unu nke-uku; nwanyi nke muru unu gēnwe iru-ihere: le, ọ gābu ọdudù mba nile, na ọzara, na ala kpọrọ nku, na ala ihe nādighi.


Site n'iwe Jehova madu agaghi-ebi nime ya, ma ọ gābusi ebe tọb͕ọrọ n'efu; ọ gēju onye ọ bula nke nāgabiga n'akuku Babilon anya, ọ gāma ọsọ n'ihi ihe-otiti-ya nile.


N'ihi na otù mba esiwo n'Ugwu rigoputa imegide ya, mba ahu gēme ka ala-ya ghọ ebe tọb͕ọrọ n'efu, ọ dighi kwa onye ganēbi nime ya: ma madu ma anumanu, ha awaghariwo, la.


Ala ahu we nāma jijiji, nāb͕ali kwa: n'ihi na èchìchè nile nke Jehova megide Babilon eguzosiwo ike, ime ka ala Babilon ghọ ebe tọb͕ọrọ n'efu, ghara inwe onye-obibi.


Babilon gāghọ kwa nání obo-ihe obo-ihe, ebe-obibi nkita-ọhia, na ihe-iju-anya, na ihe-ima-ọsọ, ghara inwe onye-obibi.


Obodo-ya nile aghọwo ihe-iju-anya, na ala kpọrọ nku, na ala ihe nādighi, bú ala nke ọ nādighi onye ọ bula nēbi nime ha, nwa madu ọ bula adighi-agabiga kwa nime ha.


Jeremaia we si Seraia, Mb͕e i bàra na Babilon, gi le anya ka i gua okwu ndia nile,


Ebe nke tọb͕ọrọ n'efu mb͕e ebighi-ebi ka M'gēme gi ka i ghọ, madu agaghi-ebi kwa n'obodo-gi nile: unu ewe mara na Mu onwem bu Jehova.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan