Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Jeremaya 51:59 - Bible Nso

59 Okwu ahu nke Jeremaia, bú onye-amuma, nyere Seraia nwa Neraia, nwa Mahseia, n'iwu, mb͕e o soro Zedekaia, bú eze Juda, je Babilon n'arọ nke-anọ nke ọbubu-eze-ya. Ma Seraia bu onye-isi idozi ebe-izu-ike nke eze.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

59 Ndị a bụ ozi Jeremaya, bụ onye amụma ziri onyeisi ozi aha ya bụ Seraya nwa Neraya, nwa Mahseia, mgbe o so Zedekaya eze Juda gaa Babilọn. E ziri ya ozi a nʼafọ nke anọ nke ọchịchị Zedekaya.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Jeremaya 51:59
6 Iomraidhean Croise  

Ma mb͕e nna-ayi-hà kpasusiri Chineke nke elu-igwe iwe, O nyere ha n'aka Nebukadneza, bú eze Babilon, onye Kaldea, o we me ka ulo a la n'iyì, o me-kwa-ra ka ndi-ayi je biri na Babilon.


O rue, n'arọ ahu, na nmalite ọbubu-eze Zedekaia, bú eze Juda, n'arọ nke-anọ, n'ọnwa nke-ise, na Hananaia nwa Azua, bú onye-amuma, nke sitere na Gibeon, gwaram okwu n'ulo Jehova, n'anya ndi-nchu-àjà na ndi Israel nile, si,


m'we were akwukwọ nzuta-ala ahu nye Beruk nwa Neraia, nwa Mahseia, n'anya Hanamel nwa nwa-nne nnam, na n'anya ndi-àmà ndi deworo aha-ha n'akwukwọ nzuta-ala ahu, n'anya ndi-Ju nile ndi nānọdu ala n'ogige ulo-nche ahu.


Jeremaia we kpọ Beruk nwa Neraia; Beruk we dere n'ọnu Jeremaia okwu nile nke Jehova, nke Ọ gwara ya-ri, n'akwukwọ-npiakọta.


Okwu ahu nke Jeremaia, bú onye-amuma, gwara Beruk nwa Neraia, mb͕e o dere okwu ndia n'akwukwọ site n'ọnu Jeremaia, n'arọ nke-anọ nke Jehoiakim nwa Josaia, bú eze Juda, si,


Zedekaia b͕ara orú arọ na otù mb͕e ọ malitere ibu eze; o we buru eze arọ iri na otù nime Jerusalem: aha nne-ya bu Hamutal nwa Jeremaia nke Libna.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan