Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Jeremaya 51:5 - Bible Nso

5 N'ihi na Israel, ma-ọbu Juda, abughi nwanyi nke di-ya, bú Chineke-ya, bú Jehova nke usu nile nke ndi-agha, nwuru anwu; ọ bu ezie na ala-ha juputara n'ikpe-ọmuma megide Onye Nsọ nke Israel.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

5 Ọ bụ ezie nʼala ha jupụtara nʼikpe ọmụma, nʼihu Onye nsọ nke Izrel, ma Chineke bụ Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile agbakụtabeghị ndị Izrel na Juda azụ.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Jeremaya 51:5
37 Iomraidhean Croise  

M'gēbi kwa n'etiti umu Israel, M'gaghi-arapu kwa ndim, bú Israel.


Ọzọ kwa, Manase wusiri ọbara nke-uku ri nne, bú nke nēmeghi ihe ọjọ, rue mb͕e o mejuru Jerusalem site n'otù ọnu-uzọ-ama rue ọnu-uzọ-ama ọzọ; nāgughi nmehie-ya nke o jiri me ka Juda mehie, ime ihe jọrọ njọ n'anya Jehova.


N'ihi na ndi-orù ka ayi bu; ma Chineke-ayi arapughi ayi n'ọbubu-orù-ayi, kama O setiwo ebere rue ayi aru n'iru ndi-eze Peasia, idebere ayi ndu, iwuli ulo Chineke-ayi elu, na ime ka nkpọnkpọ-ebe-ya nile guzo, na inye ayi mb͕idi nime Juda na nime Jerusalem.


N'ihi na Jehova agaghi-ara ndi-Ya aka, Ọ gaghi-arapu kwa ihe-nketa-Ya.


Cheta ihe ndia, Jekob; gi Israel kwa, n'ihi na orùm ka i bu: akpuwom i; orù M'nwere ka i bu: Israel, M'gaghi-echezọ gi.


Mu onwem bu kwa Jehova Chineke-gi, Onye nēme ka oké osimiri dere du, mb͕e nmali-miri-ya nile nēbib͕ọ: Jehova nke usu nile nke ndi-agha bu aha-Ya.


Ha gākpọkwa ha Ndi nsọ ahu, Ndi Jehova b͕aputaworo: agākpọ kwa gi Obodo achọputara achọputa, Obodo anārapughi arapu.


Ì jusiwo Juda? ọ̀ bu Zaion ka nkpuru-obi-Gi sọworo oyi? gini mere I ji tib͕u ayi, ma ọ dighi ọgwugwọ diri ayi? Ayi lere anya udo, ma ọ dighi ezi ihe biara; ayi lere anya mb͕e ọgwugwo, ma, le, oké egwu!


N'ìhi gini ka I di ka onye ihe b͕agwojuworo anya, dika dike nāpughi izọputa? ma Gi onwe-gi nọ n'etiti ayi, Jehova, ọ bu kwa aha-Gi ka akpọkwasiworo ayi; arapula ayi.


Ma M'gēburu uzọ kwughachi ajọ omume-ha na nmehie-ha okpukpu abua; n'ihi na ha emewo alam ka ọ ghara idi nsọ n'ozu nke nile ha nke nāsọ oyi, ọ bu kwa ihe-árú nile ha ka ha ji kpojue ihe-nketam.


N'ihi na ha arapuwom, we ghara imata ebe a, we surere chi ọzọ di iche iche ihe-nsure-ọku nēsi ísì utọ nime ya, bú ndi ha nāmaghi, ha onwe-ha na ndi bu nna-ha na ndi-eze Juda; ha emejuwo kwa ebe a n'ọbara ndi nēmeghi ihe ọjọ;


N'ihi nka ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha ji kwue okwu di otú a bayere ndi-amuma ndia, si: Le, M'gaje ime ka ha rie wormwood, M'gēme kwa ka ha ṅua miri ńsí; n'ihi na ndi-amuma nke Jerusalem ka nmeru puworo je rue ala nka nile.


Otú a ka Jehova siri: Ọ buru na agātù elu-igwe nke di n'elu, ọ buru kwa na egwuputa ntọ-ala nile nke uwa nke di n'okpuru, Mu onwem gāju kwa nkpuru nile nke Israel n'ihi ihe nile nke ha meworo; ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta.


Gi onwe-gi atula egwu, gi orùm, bú Jekob, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta); n'ihi na gi ka M'nọyere: n'ihi na M'gēme ka mba nile gwusia, bú ebe M'chugaworo gi, ma gi ka M'nāgaghi-eme ka i gwusia: ma M'gādọ gi aka na nti n'ikpé, M'gaghi-asi kwa na i bu onye ikpe nāmaghi ma-ọli.


N'ubọchi ahu, na na mb͕e ahu, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta), agāchọ ajọ omume Israel, ma ọ gaghi-adi; agāchọ kwa nmehie nile nke Juda, ma agaghi-achọta kwa ha: n'ihi na M'gāb͕aghara ndi M'nēme ka ha fọdu nmehie-ha.


Ọ bughi dika ihe ndia ka òkè Jekob bu; n'ihi na onye nākpu ihe nile ka Ọ bu; Israel bu kwa ebo nke ihe-nketa-Ya: Jehova nke usu nile nke ndi-agha bu aha-Ya.


O we sim, Ì huwo, nwa nke madu? Ọ̀ buru ulo Juda ihe di nfe ime ihe-árú nile nke ha meworo n'ebe a? n'ihi na ha emejuwo ala-ha n'ihe-ike, we chigharia ikpasum iwe; ma, le, ha nēsetipu alaka rue imi-ha.


O we sim, Ajọ omume nke ulo Israel na Juda di uku ri nne, ala-ha juputa-kwa-ra n'ọbara, obodo a juputa-kwa-ra na nwezuga ikpé: n'ihi na ha siri, Jehova arapuwo ala nka, ọ dighi kwa Jehova nāhu ihe.


Ma ọnu-ọgugu umu Israel gādi ka ájá oké osimiri, nke anāgagh ātùta, nke anāgaghi-agu kwa ọnu; ọ gēru kwa na, n'ebe ahu nke anāsi ha, Ọ bughi ndim ka unu bu, n'ebe ahu ka agāsi ha, Umu Chineke di ndu ka unu bu.


Sinu umu-nne-unu ndikom, Ami; si-kwa-nu umu-nne-unu ndinyom, Ruhama.


ka M'we ghara iyipu uwe-ya b͕aba ya ọtọ, guzo ya dika n'ubọchi amuru ya, me ya dika ọzara, do ya ka ala ọkpọ-nku, were akpiri-ikpọ-nku me ka ọ nwua;


Nurunu okwu Jehova, umu Israel: n'ihi na ikpé ka Jehova na ndi bi n'ala nka gēkpe, n'ihi na ọ dighi ezi-okwu, ọ dighi kwa ebere, ọ dighi kwa ọmuma Chineke, di n'ala nka.


Ọ bu nání ọb͕ub͕a-iyi, na okwu-ugha, na ob͕ub͕u-madu, na izu-ori, na ikwa-iko; ha etipúwo etipú, iwusi-ọbara-madu emetuwo kwa iwusi-ọbara-madu.


Ònye bu Chineke dika Gi, Nke nēbupu ajọ omume, nāgabiga kwa njehie nke diri ndi ala-nketa-Ya fọduru? O jigideghi iwe-Ya rue mb͕e ebighi-ebi, n'ihi na onye ebere nātọ utọ ka Ọ bu.


I gēnye Jekob ezi-okwu, me-kwa-ra Abraham ebere, bú nke I ṅuworo nna-ayi-hà n'iyi site n'ubọchi nile nke mb͕e ochie.


N'ubọchi ahu ka M'gēme ka ndi-isi nke usu nile nke nnù madu abua na ọgu iri nke Juda di ka ihe igu ọku n'etiti nkú, na dika ọwa nēnwu ọku n'etiti ùkwù-ọka; ha gēripia kwa ndi nile di iche iche di ha buruburu n'aka-nri na n'aka-ekpe: Jerusalem gēbi kwa ọzọ n'onodu-ya, obuná nime Jerusalem.


N'ubọchi ahu ka Jehova gēb͕ochi ndi bi na Jerusalem; onye nāsu ngọngọ n'etiti ha n'ubọchi ahu gādi kwa ka Devid; ulo Devid gādi kwa ka Chineke, dika mọ-ozi nke Jehova n'iru ha.


Jehova gēketa kwa Juda n'òkè-Ya n'elu ala nsọ a, rọputa kwa Jerusalem ọzọ.


N'ihi na Jehova agaghi-arapu ndi-Ya n'ihi aha uku Ya: n'ihi na Jehova ekwewo ime unu ka unu buru Ya otù ndi.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan