Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Jeremaya 51:46 - Bible Nso

46 Lezi-kwa-nu anya ka obi-unu ghara ilọ unu miri, ka unu ghara itu egwu n'ihi akukọ ahu nke anānu n'ala ahu; n'ihi na akukọ ahu gābia n'otù arọ, emesia n'arọ ọzọ akukọ ahu gābia kwa, ihe-ike gādi kwa n'ala ahu, onye nāchi achi nēmegide onye nāchi achi.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

46 Unu adala mba, unu atụkwala ụjọ, mgbe unu nụrụ akụkọ dị iche iche nʼala ahụ. Nʼihi na otu ụdị akụkọ ka a ga-anụ nʼafọ a, akụkọ ọzọ dị iche ka a ga-anụkwa nʼafọ nke ọzọ. A ga-anụ akụkọ iwusi ọbara nʼala ahụ, nụkwa akụkọ onye ọchịchị nke na-ebuso onye ọchịchị ọzọ agha.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Jeremaya 51:46
16 Iomraidhean Croise  

Le, M'nētiye otù mọ nime ya, ọ gānu kwa akukọ, laghachi n'ala-ya; M'gēme kwa ka ọ da site na mma-agha n'ala-ya.


Umu Amon na Moab we guzo imegide ndi bi n'ugwu Sia, iwezuga ha ka ebibie ha na ikpochapu ha: mb͕e ha mere ka ndi bi na Sia gwusia, ha we yere onwe-ha aka, nwoke na ibe-ya, ibibi onwe-ha.


N'ihi na Chineke emewo ka obim lọ miri, Onye puru ime ihe nile emewo kwa ka m'ma jijiji:


Ọ buru na i di ume-ngwu n'ubọchi ahuhu, Ike-gi pere npe.


M'gākwali kwa Ijipt megide Ijipt: ha gēbu kwa agha, onye ọ bula megide nwa-nne-ya, onye ọ bula megide kwa ibe-ya, obodo megide obodo, ala-eze megide ala-eze.


Atula egwu; n'ihi na gi ka M'nọyere: M'gēme ka nkpuru-gi si n'Ọwuwa-anyanwu bia, M'gēsi kwa n'Ọdida-anyanwu chikọta gi;


Ma gi onwe-gi, atula egwu, gi orùm, bú Jekob, atu-kwa-la ujọ, gi Israel: n'ihi na, le, M'gaje izọputa gi n'ebe di anya, zọputa kwa nkpuru-gi n'ala ọzọ ebe emere ka ha je biri; Jekob gālata kwa, nọ jū n'aru mgbū, ọ dighi kwa onye ganēme ka ọ ma jijiji.


Gi onwe-gi atula egwu, gi orùm, bú Jekob, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta); n'ihi na gi ka M'nọyere: n'ihi na M'gēme ka mba nile gwusia, bú ebe M'chugaworo gi, ma gi ka M'nāgaghi-eme ka i gwusia: ma M'gādọ gi aka na nti n'ikpé, M'gaghi-asi kwa na i bu onye ikpe nāmaghi ma-ọli.


Ma mb͕e ihe ndia malitere ime, lenu anya n'elu, welikwanu isi-unu; n'ihi na nb͕aputa-unu nēru nso.


Ha we fùa ọgu opì-ike iri-na-ise ahu, Jehova we me ka mma-agha nwoke ọ bula di n'aru ibe-ya, na n'aru ọmuma-ulo-ikwū ahu nile: ọmuma-ulo-ikwū ahu we b͕alaga rue Bet-shita n'uzọ Zerera, rue uzọ Ebel-mehola, n'akuku Tabat.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan