Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Jeremaya 51:43 - Bible Nso

43 Obodo-ya nile aghọwo ihe-iju-anya, na ala kpọrọ nku, na ala ihe nādighi, bú ala nke ọ nādighi onye ọ bula nēbi nime ha, nwa madu ọ bula adighi-agabiga kwa nime ha.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

43 Obodo ya niile ga-atọgbọrọ nʼefu, ọ ga-abụ ebe kpọrọ nkụ, na ala ọzara, ọ ga-aghọ ala onye ọbụla na-agaghị ebi nʼime ya, nke mmadụ ọbụla na-agaghị esi nʼetiti ya gafee.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Jeremaya 51:43
12 Iomraidhean Croise  

Jenu, hu ọlu nile nke Jehova, Onye doworo ihe-iju-anya di iche iche n'uwa,


Ọ gaghi-abu ebe-obibi ọzọ rue mb͕e ebighi-ebi; agaghi-ebi kwa nime ya rue ọb͕ọ nile: onye Arebia agaghi-ama kwa ulo-ikwū-ya n'ebe ahu; ndi-ọzùzù-aturu agaghi-eme kwa ka aturu-ha makpue n'ebe ahu.


Ogwu gēpú kwa n'ulo-elu-ya nile, akuba na ọhia-ogwu n'ebe-ya nile ewusiri ike: o we ghọ ebe-obibi nkita-ọhia, ogige nke diri enyi-nnunu.


Ma ihe ọjọ abiakwasiwo gi; i gaghi-ama chi-ọbubọ di ya: nbibi gādakwasi kwa gi; i gaghi-enwe ike ikpuchi anya-ya: ila-n'iyì gābiakwasi kwa gi na mberede, nke i nāmaghi.


ime ka ala-ha ghọ ihe-iju-anya, na ihe-ima-ọsọ mb͕e ebighi-ebi; ọ gēju onye ọ bula nke nāgabiga n'akuku ya anya, o gēfufe kwa isi-ya.


Ha asighi kwa, Òle ebe Jehova nọ, bú Onye meworo ka ayi si n'ala Ijipt rigoputa; Onye meworo ka ayi je ije n'ọzara, n'ala nke ebe ihe nādighi na nke olùlù, n'ala ọkpọ-nku na nke onyinyo ọnwu, n'ala nke ọ nādighi onye gabigara nime ya, na nke madu nēbighi n'ebe ahu?


ihere gēme nne-unu nke-uku; nwanyi nke muru unu gēnwe iru-ihere: le, ọ gābu ọdudù mba nile, na ọzara, na ala kpọrọ nku, na ala ihe nādighi.


Ala ahu we nāma jijiji, nāb͕ali kwa: n'ihi na èchìchè nile nke Jehova megide Babilon eguzosiwo ike, ime ka ala Babilon ghọ ebe tọb͕ọrọ n'efu, ghara inwe onye-obibi.


Babilon gāghọ kwa nání obo-ihe obo-ihe, ebe-obibi nkita-ọhia, na ihe-iju-anya, na ihe-ima-ọsọ, ghara inwe onye-obibi.


si, Jehova, Gi onwe-gi ekwuwo okwu bayere ebe a ibipu ya, ka ihe ọ bula we ghara ibi nime ya, ma ọ bu madu ma-ọbu anumanu, n'ihi na ebe tọb͕ọrọ n'efu mb͕e ebighi-ebi ka ọ gābu.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan