Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Jeremaya 51:34 - Bible Nso

34 Nebukadreza, bú eze Babilon, eripiawom, o kpochapuwom, o mewom ka m'ghọ aria nke ihe nādighi, o lowom dika ogologo anu-miri, o mejuwo afọ-ya n'ihe-utọm nile, ọ chupuwom.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

34 “Nebukadneza eze Babilọn eripịala anyị, o tinyela anyị nʼọnọdụ mgbagwoju anya. O meela ka anyị dịrị ka ite ihe na-adịghị nʼime ya. O lodara anyị dịka ọ bụ agwọ ọjọọ, jiri ihe ụtọ anyị niile mejuo afọ ya. Emesịa, ọ gbọpụtara anyị.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Jeremaya 51:34
21 Iomraidhean Croise  

O lodawo àkù, we b͕oputa ya: Chineke gēsi n'afọ-ya napu ya àkù ahu.


Gi onwe-gi were ike-Gi tiwa oké osimiri: I tipiara isi nile nke ogologo anu-miri n'elu miri.


Ka ayi lo ha na ndu dika ala-mọ, Bú ndi zuru okè, dika ndi nārida n'olùlù;


Ma okwolo na ebinta gēnweta ya; okwukwu na ugolo-ọma gēbi nime ya: Ọ gēseti kwa eriri nke itọb͕ọrọ-n'efu na nkume-ọtùtù nke itọb͕ọrọ-nkiti n'elu ya.


Ma ndi nka bu ndi alutaworo ihe-ha n'agha na ndi apunaraworo ha ihe; ha adawo n'ib͕udu n'olùlù, ha nile, ọ bu kwa n'ulo-nkpọrọ di iche iche ka ezobeworo ha: ha aghọwo ihe-nluta-n'agha, ma ọ dighi onye-nnaputa; ha aghọwo ihe apunaraworo madu, ma ọ dighi onye nāsi, Nyeghachi.


Aturu nke emeworo ka ọ wagharia ka Israel bu; ọdum di iche iche achupuwo ya: ọdum nke-mbu, bú eze Asiria, ripiara ya; ma ọdum ikpe-azu a, bú Nebukadreza eze Babilon, ab͕ajiwo ọkpukpu-ya nile.


Ndi nile ndi nāchọputa ha eripiawo ha: ndi nākpab͕u ha siri, Ikpe amaghi ayi, n'ihi na ha emehiewo megide Jehova, bú ebe-obibi nke ezi omume, na olile-anya nke ndi bu nna-ha, bú Jehova.


M'gēji kwa nmehie-ya leta Bel nime Babilon, M'gēme kwa ka ihe o loworo si n'ọnu-ya puta; mba di iche iche agaghi-erùkuru kwa ya ọzọ dika miri: ọzọ mb͕idi Babilon gāda.


Ọbuná Babilon aghaghi ida, unu ndi eb͕uru eb͕u nke Israel, ọ bu kwa na Babilon ka ndi ala ahu nile eb͕uru eb͕u gāda.


Le, ka obodo ahu nke ndi-ya di ọtutu si nọdu ala nání ya! Le, ka o siworo ghọ ihe di ka nwanyi di-ya nwuru! Obodo nke riri nne n'etiti mba nile, nke bu isi n'etiti ala nile anāchi achi, Le, ka o siworo ghọ usu ndi nēfè òfùfè.


Ndi-iro-gi nile asaghepuwo ọnu-ha imegide gi; Ha amawo ọsọ̀, ta ikekere-ezé; ha asiwo, Ayi elodawo ya; N'ezie nka bu ubọchi ahu nke ayi lere anya ya; ayi achọtawo, ayi ahuwo.


n'ihi nka bue amuma, si, Otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri: N'ihi na, ọbuná n'ihi na ha emewo ka unu tọb͕ọrọ n'efu, na n'ihi na ha eledawo unu buruburu, ka unu we ghọrọ mba nile fọdurunu ihe-nnweta, ewe me ka unu rigokwasi n'eb͕ub͕ere-ọnu nke ndi-ire, buru akukọ ọjọ nke ndi-unu:


Elodawo Israel: ub͕u a ha aghọwo ihe dika ihe nādighi-atọ utọ n'etiti mba nile.


Nurunu nka, unu ndi nēkusi ume ike ilo ob͕eye, ndi nāchọ kwa ime ka ndi ala-unu ewedara n'ala kwusi,


N'ihi na Jehova neme ka nbili-elu nke Jekob lata, dika nbili-elu nke Israel: n'ihi na ndi-nwusi awusiwo ha dika miri, ọ bu kwa ngalaba-vine nile ha ka ha bibiworo.


Ma ahuhu gādiri unu, ndi-ode-akwukwọ na ndi-Farisi, ndi-iru-abua; n'ihi na unu nēmechi uzọ ala-eze elu-igwe n'iru madu: n'ihi na unu onwe-unu abataghi, unu adighi-ekwe kwa ndi nābata ka ha bata.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan