Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Jeremaya 51:31 - Bible Nso

31 Otù ọb͕a-ọsọ gāb͕a ọsọ izute ọb͕a-ọsọ-ibe-ya, otù onye-ngosi gāb͕a kwa ọsọ izute onye-ngosi-ibe-ya, igosi eze Babilon na ewerewo obodo-ya na nsọtu-ya:

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

31 Otu onye na-agba ọsọ na-agbaso ọgba ọsọ ibe ya, otu onyeozi na-esochikwa onyeozi ọzọ nʼazụ; ha niile na-abịa izi eze Babilọn ozi sị ya na a dọtala obodo ya nʼagha,

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Jeremaya 51:31
16 Iomraidhean Croise  

Ndi-ọb͕a-ọsọ we were akwukwọ-ozi sitere n'aka eze na ndi-isi-ya jeghari n'Israel na Juda nile, na dika ihe eze nyere n'iwu si di, si, Umu Israel, laghachikutenu Jehova, bú Chineke Abraham na Aisak na Israel, ka O we laghachikuru ndi b͕apuru ab͕apu ndi fọduru unu site n'aka ndi-eze Asiria.


O we de akwukwọ n'aha eze, bú Ahasuerọs, were nb͕a-aka-akàrà eze kà ya, zìga akwukwọ n'aka ndi-ọb͕a-ọsọ ndi inyinya nēbu, bú ndi inyinya ukwu ọsọ na inyinya mule na umu-inyinya nēbu:


Ndi-ọb͕a-ọsọ ndi inyinya ukwu ọsọ na inyinya mule nēbu puru, ebe ewere okwu eze kwalie ha, me ka ha me ngwa; enye-kwa-ra iwu ahu nime Shushan, bú ulo uku eze.


Ma ubọchim nile di garagara kari ọb͕a-ọsọ: Ha ab͕alagawo, ha ahughi ezi ihe.


Ntipia n'elu ntipia ka anākpọ; n'ihi na ebibiwo ala nka nile: na mberede ka ebibiworo ulo-ikwūm nile, n'otù ntabi-anya ka ebibiworo ákwà-nkwubam nile.


Gosinu n'etiti mba nile, menu ka anuru ya, bulienu ọkọlọtọ; menu ka anuru ya, unu ezobela: sinu, Ewerewo Babilon, emewo ka ihere mee Bel, Merodak atuwo ujọ; emewo ka ihere me arusi-ya nile akpuru akpu, arusi-ya nile atuwo ujọ.


Esiworom i ọnyà, ọzọ kwa, amawo gi n'ọnyà ahu, gi Babilon, ma gi onwe-gi amagh: achọtawo gi, ọzọ kwa, ejidewo gi, n'ihi na Jehova ka i lusoworo ọ̀gù.


Eze Babilon anuwo ùdé-ha, aka-ya abua we kuda: ihe-nb͕u ejidewo ya, ihe-nb͕ali dika nke nwanyi ime nēme.


ọ bu kwa ngabiga-miri nile ka ewereworo, ọ bu kwa ọdọ-miri nile ka ha sureworo ọku, ndi-agha amawo kwa jijiji.


N'abali ahu ka eb͕uru Belshaza, bú eze Kaldea.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan