Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Jeremaya 51:30 - Bible Nso

30 Ndi-dike Babilon arapuwo ibu agha, ha nọduru n'ebe nile ha ewusiri ike; idi-ike-ha alasiwo; ha aghọwo ndinyom: ndi-iro-ha esuyewo ọku n'ebe-obibi-ya nile; etijiwo ihe-ntuchi-ya nile.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

30 Ndị bụ dike nʼagha na Babilọn akwụsịla ịlụ ọgụ; ha anọgidela nʼebe ha e wusiri ike. Ike agwụla ha; ha adịla ka ndị inyom. E sunyela ebe obibi ya niile ọkụ, tijiekwa mkpọrọ e ji akpọchi ọnụ ụzọ ama ya niile.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Jeremaya 51:30
16 Iomraidhean Croise  

N'ihi na O tipiawo ibo-ọnu-uzọ nile nke ọla, B͕uji kwa ihe-ntuchi nile nke ígwè.


N'ihi na O mewo ka ihe-ntuchi nile nke ọnu-uzọ-ama-gi nile di ike; Ọ gọziwo umu-gi n'etiti gi.


Akwatawo ihe ndi nwere obi ike n'agha, ha atuwo òrù-ura-ha; Ha achọtaghi kwa aka-ha, bú ndi nile bu dìnkpà.


N'ubọchi ahu Ijipt gādi ka ndinyom: ọ gāma kwa jijiji tu kwa egwu n'ihi nfeghari aka nke Jehova nke usu nile nke ndi-agha, nke Ya onwe-ya nēfeghari n'elu ya.


Le, ha di ka ahihia-ọka kpọrọ nku; ọku erewo ha; ha agaghi-anaputa onwe-ha n'aka ire ọku: ọ bughi icheku-ọku nēre ere iji nya ọku, ọ bughi kwa ọku inọdu n'iru ya.


Ewerewo Keriot, anarawo kwa ebe nile ewusiri ike, obi ndi-dike Moab n'ubọchi ahu gādi kwa ka obi nwanyi ime nēme.


Kpọnu nkpu-agha megide ya buruburu; o kweyewo ekweye; ihe-nkwagide-ya nile adawo, etikpọwo kwa mb͕idi-ya nile: n'ihi na ibọ̀-ọ́bọ̀ Jehova ka ọ bu: bọ̀nu ya ọ́bọ̀; dika ọ meworo, menu ya otú a.


ọ bu kwa ngabiga-miri nile ka ewereworo, ọ bu kwa ọdọ-miri nile ka ha sureworo ọku, ndi-agha amawo kwa jijiji.


M'gēme kwa ndi-isi-ya, na ndi-ya mara ihe, na ndi-ya nāchi ala, na ndi-ya nọchiri anya eze, na ndi-dike-ya, ka ha ṅubiga manya ókè; ha gāraru kwa ura ebighi-ebi, ghara iteta; ọ bu ihe si n'ọnu Eze ahu puta, Jehova nke usu nile nke ndi-agha bu aha-Ya.


Ọnu-uzọ-ama-ya nile emikpuwo n'ala; O mewo ka ihe-ntuchi-ya nile la n'iyì, Ọ b͕ajiwo kwa ha: Eze-ya na ndi-isi-ya nọ n'etiti mba nile ebe iwu nādighi; Ọzọ, ndi-amuma-ya achọtaghi ọhù nke sitere na Jehova.


M'gētiji kwa nkpọrọ Damaskọs, si na ndagwurugwu Even bipu onye bi ya, si kwa n'ulo Eden bipu onye nējide nkpa-n'aka-eze: agēme kwa ka ndi Siria je biri n'ala ọzọ, bú Kia; otú a ka Jehova siri.


Le, ndi-gi bu ndinyom n'etiti gi; ndi-iro-gi ka emeghepusiworo ọnu-uzọ-ama nile nke ala-gi nye: ọku eripiawo ihe-ntuchi-gi nile.


ka ha nēguzo n'ebe di anya n'ihi egwu nke nmekpa-aru-ya, nāsi, Ahuhu, ahuhu, obodo uku ahu, Babilon, bú obodo ahu di ike! n'ihi na n'otù oge hour ka ikpé-gi biara.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan