Jeremaya 51:25 - Bible Nso25 Le, Mu nēmegide gi, gi ugwu nēbibi ebibi, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta), nke nēbibi uwa nile: M'gēseti kwa akam imegide gi, kpọreda gi site na nkume-gi nile di elu, mee ka i ghọ ugwu esurere esure. Faic an caibideilBaịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a25 “Edoola m onwe m imegide gị, gị ugwu ukwu na-emebisi ihe, gị onye na-ala ụwa niile nʼiyi.” Otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara. “Aga m esetipụ aka m megide gị, kwapụ gị site na nkume dị elu. Aga m emekwa gị ka ị bụrụ ugwu ukwu e suru ọkụ. Faic an caibideil |
le, M'gaje iziga chiri ab͕uru nile nke Ugwu, (ọ̀ bu ihe si n'ọnu Jehova puta), ọ bu kwa Nebukadreza, bú eze Babilon, bú orùm, ka M'gēzigara ozi, M'gēme kwa ka ha bia imegide ala nka, na imegide ndi bi ya, na imegide mba nile ndia nọ ya buruburu; M'gēwezuga kwa ha ka ebibie ha, M'gēme kwa ha ka ha ghọ ihe-iju-anya, na ihe-ima-ọsọ, na nkpọnkpọ ebe di mb͕e ebighi-ebi.
Otú a ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha siri: Mb͕idi nile nke Babilon nke sara mbara, agēme ka ha ghọ ebe dasiri adasi, ọzọ, ọnu-uzọ-ama-ya nile nke di elu, agēji ọku sure ha; ndi nile di iche iche gādọb͕u kwa onwe-ha n'ọlu n'efu, mba di iche iche gādọb͕u onwe-ha n'ọlu itiye n'ọku: ike ewe gwu ha.