Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Jeremaya 51:24 - Bible Nso

24 M'gākwughachi kwa Babilon, kwughachi kwa ndi nile bi na Kaldea, ihe ọjọ nile ha nke ha meworo nime Zaion n'anya-unu; ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

24 “Nʼihu gị ka m ga-anọ kwụghachi Babilọn na ndị niile bi na Babilọn ihe ọjọọ niile ha mere na Zayọn,” ọ bụ ihe Onyenwe anyị kwubiri.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Jeremaya 51:24
25 Iomraidhean Croise  

N'ìhi gini ka mba nile nāsi, Òle ebe Chineke-ha nọ? Ka amara ya n'etiti mba nile n'anya-ayi, Bú ibọ̀-ọ́bọ̀ ọbara nke ndi-orù-Gi nke awusiworo.


Chikọtanu onwe-unu, unu nile, nuru kwa; ònye n'etiti ha gosiworo ihe ndia? Onye ahu Jehova huworo n'anya gēme ihe nātọ Ya utọ na Babilon, ọ bu kwa ogwe-aka-ya gādakwasi ndi Kaldea.


ikpọsa arọ mb͕e ihe madu nātọ Jehova utọ, na ubọchi ibọ̀-ọ́bọ̀ Chineke-ayi nwere; ikasi ndi nile nēru újú obi;


Ge nti, olu nkpọtu nēsite n'obodo, olu nēsite n'ulo uku Chineke, bú olu Jehova Onye nākwughachi ndi-iro-Ya nmeso-ha.


N'ihi na ọtutu mba na ndi-eze nke di uku gēme ka ha fè ha òfùfè, ọbuná ha onwe-ha: M'gākwughachi kwa dika omume nile ha si di, na dika ọlu nke aka-ha si di.


Kaldea gāghọ kwa ihe-nkwata: afọ gēju ndi nile ndi nākwata ya; ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta.


Kpọnu nkpu-agha megide ya buruburu; o kweyewo ekweye; ihe-nkwagide-ya nile adawo, etikpọwo kwa mb͕idi-ya nile: n'ihi na ibọ̀-ọ́bọ̀ Jehova ka ọ bu: bọ̀nu ya ọ́bọ̀; dika ọ meworo, menu ya otú a.


Muchanu àkú nile; jidesienu ọta nile ike: Jehova akpọtewo mọ nke ndi-eze Midia; n'ihi na imegide Babilon ka nzube-Ya di, ibibi ya: n'ihi na ibọ̀-ọ́bọ̀ Jehova ka ọ bu, bú ibọ̀-ọ́bọ̀ nke ulo uku Ya.


ọ bu kwa gi ka M'gēji tipia onye-ọzùzù-aturu na ìgwè aturu-ya; ọ bu kwa gi ka M'gēji tipia onye-ọlu-ubi na ehi-ya ejikọrọ abua abua; ọ bu kwa gi ka M'gēji tipia ndi nāchi ala na ndi nọchiri anya eze.


Ihe-ikem na nke anu-arum di n'isi Babilon, ka nwanyi nke bi na Zaion gāsi; ọzọ, Ọbaram di n'isi ndi bi na Kaldea, ka Jerusalem gāsi.


Ọbuná Babilon aghaghi ida, unu ndi eb͕uru eb͕u nke Israel, ọ bu kwa na Babilon ka ndi ala ahu nile eb͕uru eb͕u gāda.


n'ihi na onye nāpunara ya ihe-ya ab͕iakwasiwo obodo ahu, bú Babilon, ejidewo kwa ndi-dike-ya, ab͕ajisiwo uta nile ha: n'ihi na Chineke nke nēmeso madu otú ha si eme ka Jehova bu, Ọ ghaghi ikwughachi.


I gēnyeghachi ha nmeso-ha, Jehova, dika ọlu aka-ha si di.


Ka obi nātọ gi utọ n'isi ya, gi elu-igwe, na unu ndi nsọ, na unu ndi-ozi, na unu ndi-amuma; n'ihi na Chineke kpere ikpé-unu n'aru ya.


Ọ bu kwa nime ya ka ahuru ọbara nke ndi-amuma na nke ndi nsọ, na nke ndi nile eb͕uworo n'elu uwa.


ha we were oké olu tie nkpu, si, Rùe ole mb͕e, Onye-nwe-ayi, Onye di nsọ, buru kwa Onye-ezi-okwu, ka I nēkpeghi ikpé bọ̀ kwa ọ́bọ̀ ọbara-ayi n'isi ndi bi n'elu uwa?


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan