Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Jeremaya 51:21 - Bible Nso

21 ọ bu kwa gi ka M'gēji tipia inyinya na onye nānọkwasi ya; ọ bu kwa gi ka M'gēji tipia ub͕ọ-ala na onye nānọkwasi ya;

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

21 gị ka m ga-eji tipịa ịnyịnya na onye na-agba ya, gị ka m ga-eji tipịa ụgbọ agha na onye na-anya ya;

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Jeremaya 51:21
14 Iomraidhean Croise  

Nēme ka agha nile kwusi rue nsọtu uwa; Ọ nāb͕aji uta, b͕upia kwa ube; Ọ nēsure ub͕ọ-ala nile n'oku.


Site n'ibasi-nba-ike nke Gi, Chineke nke Jekob, Ma ub͕ọ-ala ma inyinya adawo n'oké ura.


Mb͕e ahu Moses na umu Israel nābukuru Jehova abù a, ha kwue, si, Ka m'bukue Jehova abù, n'ihi na O biliwo elu nke-uku: Inyinya na onye o nēbu, Ọ tubàwo ha n'oké osimiri.


Miriam we za ha, si, Unu bukue Jehova abù, n'ihi na O biliwo elu nke-uku; Inyinya na onye o nēbu, Ọ tubàwo ha n'oké osimiri.


Ub͕ọ-ala Fero nile na usu-ndi-agha-ya ka O tufuworo n'oké osimiri: Ndi-isi-agha-ya arọputara arọputa, ha emikpuwo emikpu n'Oké Osimiri Uhie.


Nke nēme ka ub͕ọ-ala na inyinya na usu-ndi-agha na dìnkpà puta; n'otù ka ha nēdinakọta, ha agaghi-ebili; ha anyu a, dika ogho-oriọna ka emenyuworo ha emenyu:


Mma-agha di n'ebe inyinya-ya nile di, na n'ebe ub͕ọ-ala-ya di, na n'ebe ndi nile gwara ọgwa nọ, bú ndi nọ n'etiti ya, ha gāghọ kwa ndinyom: mma-agha di n'ebe àkù-ya nile di, agāluta kwa ha n'agha.


Afọ inyinya na ub͕ọ-ala na ndi-dike na ndi-agha nile gēju unu table nkem; ọ bu ihe si n'ọnu Onye-nwe-ayi Jehova puta.


Ọ gēru kwa n'ubọchi ahu, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta), na M'gēbipu inyinya-gi nile n'etiti gi, me ka ub͕ọ-ala-gi nile la n'iyì:


Le, Mu nēmegide gi, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova nke usu nile nke ndi-agha puta), M'gēsure kwa ub͕ọ-ala-ya n'anwuru-ọku, ọ bu kwa umu-ọdum-i ka mma-agha gēripia: M'gēbipu kwa anu-ndọb͕u-gi n'uwa, agaghi-anu kwa olu ndi-ozi-gi ọzọ.


M'gākwatu kwa oche-eze nke ala-eze nile, M'gēkpochapu kwa ike nke ala-eze nile nke mba nile; M'gākwatu kwa ub͕ọ-ala, na ndi nānọkwasi ha; inyinya na ndi nānọkwasi ha gārida kwa, onye ọ bula site na mma-agha nwa-nne-ya.


Ha gādi kwa ka ndi-dike, nāzọda ndi-iro-ha n'apiti èzí nile n'agha; ha gēbu kwa agha, n'ihi na Jehova nọyere ha: ihere gēme kwa ndi nānọkwasi inyinya.


N'ubọchi ahu, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta), M'gēji ibobo tib͕ue inyinya ọ bula, ji kwa ara-ọwiwi tib͕ue onye nānọkwasi ya: ọ bu kwa ulo Juda ka M'gāsaghe anyam abua lekwasi, ọ bu inyinya nile ọ bula nke ndi nile di iche iche ka M'gēji ikpu-ìsì tib͕ue.


ka unu we rie anu-aru ndi-eze, na anu-aru ndi-ọchi-agha, na anu-aru ndi di ike, na anu-aru inyinya na nke ndi nānọkwasi ha, na anu-aru madu nile, ma ndi nwere onwe-ha ma ndi-orù, ma ndi ntà ma ndi uku.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan