M'gāgabiga kwa n'ala Ijipt n'abali ahu, tib͕u nwa ọ bula eburu uzọ mu n'ala Ijipt, ma madu ma anumanu; ọ bu kwa n'aru chi nile nke Ijipt ka M'gēme ihe nile ekpere n'ikpe: Mu onwem bu Jehova.
Ibu eboro Ijipt. Le, n'igwe-oji nke nāb͕a ọsọ ka Jehova nānọkwasi dika inyinya, O we bia rue Ijipt: ihe-efu nile nke Ijipt gēme kwa nkpatu n'iru Ya, obi Ijipt gālọ kwa ya miri n'etiti ya.
Bel eruruwo ala, Nebo amakpuwo amakpu; arusi nile ha di n'elu anumanu na n'elu anu-ulo: ihe nile unu nēbughariri bu ibu eboro ebo, ha bu ibu eboro anu nāda #mbà.
Nání anu-ọhia ka madu ọ bula ghọworo site n'ihe-ọmuma-ya; emewo ka ihere me onye-nnucha-ọla ọ bula site n'arusi-ya apiri api: n'ihi na okwu-ugha ka arusi-ya awuru awu bu, nku-ume adighi kwa nime ha.
N'ihi na ndim echezọwom, ihe-efu ka ha sureworo ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ nye; ha we me ka ha su ngọngọ n'uzọ nile ha, bú uzọ-ije nile nke mb͕e ebighi-ebi gara aga, ije ije n'okporo-uzọ di iche iche, bú uzọ anātulighi atuli;
Jehova nke usu nile nke ndi-agha, bú Chineke nke Israel, siri: Le, M'gaje iji nmehie-ha leta Amon nke No, leta kwa Fero, leta kwa Ijipt, leta kwa chi-ya nile, leta kwa ndi-eze-ya; ọbuná Fero, na ndi nātukwasi ya obi:
N'ihi na ọ bu n'ihi na i tukwasiwo obi-gi n'ọlu-gi nile na n'àkù-gi nile ka agēwere kwa gi onwe-gi: Kemosh gāpu kwa so ndi gēje biri n'ala ọzọ, na ndi-nchu-àjà-ya na ndi-isi-ya n'otù.
Gosinu n'etiti mba nile, menu ka anuru ya, bulienu ọkọlọtọ; menu ka anuru ya, unu ezobela: sinu, Ewerewo Babilon, emewo ka ihere mee Bel, Merodak atuwo ujọ; emewo ka ihere me arusi-ya nile akpuru akpu, arusi-ya nile atuwo ujọ.
N'ebe-obibi nile unu ka agēme ka obodo nile ghọ nkpọnkpọ ebe, ebe nile di elu gātọb͕ọ kwa n'efu; ka ebe-ichu-àjà nile unu we ghọ nkpọnkpọ ebe, tọb͕ọrọ kwa n'efu, ka ewe tipia kwa arusi nile unu, ha ewe kwusi, ka ewe b͕utu kwa arusi-anyanwu nile unu, hichapu ọlu nile unu.
Onye di egwu ka Jehova gābu n'imegide ha: n'ihi na Ọ gēme ka chi nile nke uwa ta aru; madu gākpọ kwa isi ala nye Ya, onye ọ bula site n'ọnọdu-ya, bú agwe-etiti nile nke mba nile.
nāsi, Ndikom, gini mere unu nēme ihe ndia? Ayi onwe-ayi bu kwa madu yiri unu n'aru-ayi, ayi nēzì kwa unu ozi ọma, ka unu si n'ihe-efu ndia chigharikute Chineke Nke di ndu, Onye kère elu-igwe na ala na oké osimiri, na ihe nile di ha nime: