Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Jeremaya 51:16 - Bible Nso

16 mb͕e Ọ nēme ka olu-Ya da, ùzù miri di n'elu-igwe, O we me ka alulu si na nsọtu uwa kwugo; O meworo miri-ozuzo àmùmà, Ọ nēme kwa ka ifufe si n'olu-nkwakọba-Ya nile puta.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

16 Mgbe o bigbọrọ, mmiri niile nke dị nʼeluigwe na-ebigbọkwa. Ọ na-eme ka igwe ojii site na nsọtụ niile nke ụwa kwụlie. Ọ na-ezipụ amụma mgbe mmiri na-ezo, na-esitekwa nʼụlọ nkwakọba ihe ya na-ewepụta ifufe.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Jeremaya 51:16
24 Iomraidhean Croise  

Ma Chineke chetara Noa, na anu nile di ndu, na anu-ulo nile nke ya na ha nọ n'ub͕ọ; Chineke we me ka ifufe gabiga n'elu uwa, miri we taba;


Ma ọ bu n'ihi nkpa-n'aka, ma-ọbu n'ihi uwa-Ya, Ma-ọbu n'ihi ebere, ka Ọ nēme ka ọ biarue.


Ì bàwo n'ulo-nkwakọba nile nke snow, Ma-ọbu ì nāhu ulo-nkwakọba nile nke ákú-miri-igwe,


Ma-ọbu ọ̀ bu ogwe-aka dika Chineke ka i nwere? Ọ̀ bu kwa olu dika Ya ka i gēji ma dika éb͕è-elu-igwe?


Site n'ibasi-nba-ike-Gi ha nāb͕alaga; Site n'olu éb͕è-elu-igwe-Gi ha nāzọli ọsọsọ;


Ọ bu Onye nēme ka alulu si na nsọtu uwa kwugo; O meworo miri-ozuzo àmùmà; Ọ bu Onye nēme ka ifufe si n'ulo-nkwakọba-Ya nile puta.


Ọ nēzipu okwu-Ya, we b͕aze ha: Ọ nēme ka ifufe-Ya fe, miri we rùe.


Jehova we ma éb͕è-elu-igwe n'elu-igwe, Onye kachasi ihe nile elu nēme kwa ka olu-Ya da; Ákú-miri-ígwé na icheku ọku.


Mba nile ozo b͕ara aghara, ewezugara ala-eze nọnọdu-ha: O mere ka olu-Ya da, uwa nabaze.


Bùkuenu Onye ahu Nke elu-igwe kachasi elu-igwe nile, nke di mb͕e ochie, nēbu dika inyinya; Le, Ọ nēme ka olu-Ya da udà, ọ bu olu ike.


O nēme ka ifufe Iru-anyanwu bulie ije n'elu-igwe: O ji-kwa-ra ike-Ya duru ifufe Ndida.


Moses we setipu nkpa-n'aka-ya n'elu ala Ijipt, Jehova we dubata ifufe Iru-anyanwu n'ala ahu ehihie ahu nile na abali ahu nile: mb͕e o ruru ututu ifufe Iru-anyanwu ahu butere igurube.


Jehova we me ifufe Ọdida-anyanwu di ike nke-uku ka o chigharia, nke buru igurube, fere ha ga n'Oké Osimiri Uhie; ọ dighi otù igurube fọduru n'ókè-ala ọ bula nke Ijipt.


Moses we setipu aka-ya n'elu oké osimiri; Jehova we were ifufe Iru-anyanwu di ike me ka oké osimiri ahu je n'azu n'abali ahu nile, Ọ we me oké osimiri ahu ka ọ buru ala-akọrọ, ewe kewa miri ahu.


Anu-kwa-ra olu nkù nile nke cherubim rue ogige di n'èzí, dika olu nke Chineke Nke puru ime ihe nile mb͕e Ọ nēkwu okwu.


Ọ̀ bughi ndi di ka umu ndi Etiopia ka unu burum, unu umu Israel? ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta. Ọ̀ bughi Israel ka M'meworo ka ha si n'ala Ijipt rigoputa, na ndi Filistia site na Kaftoa, na ndi Siria site na Kia?


Ma Jehova tubàra ifufe di uku n'oké osimiri, oke ifufe di uku we di n'oké osimiri, ewe chè na ub͕ọ gētiwa.


O rue, mb͕e anyanwu wara, na Chineke guputara otù ifufe Iru-anyanwu di ọku; anyanwu we tikwasi Jona n'isi, ike we gwusia ya, o we riọ Chineke ndu-ya ka ọ nwua, si, Ọ kam nma inwu ọnwu kari idi ndu.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan