Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Jeremaya 51:10 - Bible Nso

10 Jehova emewo ka ezi omume nile ayi puta: bianu, ka ayi kọ akukọ ọlu Jehova, bú Chineke-ayi, nime Zaion.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

10 “ ‘Onyenwe anyị emeela ka ezi omume anyị pụta ìhè. Ka anyị kwupụta ihe Onyenwe anyị Chineke anyị mere na Zayọn.’

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Jeremaya 51:10
18 Iomraidhean Croise  

M'gaghi-anwu, kama m'gādi ndu, M'gākọ kwa akukọ ọlu nile nke Ja.


Ọ gēme kwa ka ezi omume-gi puta dika ìhè, Ikpé-gi kwa dika etiti-ehihie.


Madu nile gātu kwa egwu; We gosi ọlu Chineke, Were uche chè èchìchè bayere omume-Ya.


Bianu, nuru, unu nile ndi nātu egwu Chineke, M'gākọ kwa akukọ bayere ihe O meworo nkpuru-obim.


Ka m'we kọ akukọ otuto-Gi nile: N'ọnu-uzọ-ama nile nke ada Zaion, Ka m'ṅuria ọṅu na nzọputa-Gi.


Ndi ahu gēbuli olu-ha, ha gēti nkpu ọṅù; n'ihi nbili-elu Jehova ha gēsi n'oké osimiri tisie nkpu ike.


Gwanu Jerusalem okwu gābà ya n'obi, kpọ-kwa-nu ya òkù, si, na obubu-agha-ya ezuwo, na ahuhu ajọ omume-ya atọjuwo Chineke utọ, na ọ natawo n'aka Jehova okpukpu abua n'ihi nmehie-ya nile.


Ndi Jehova ab͕aputara ab͕aputa gālata kwa, were iti-nkpu-ọṅù bata nime Zaion; ọṅù ebighi-ebi gādi kwa n'isi-ha: obi-utọ na ọṅù ka ha gābiarute, iru-újú na ize-ume ab͕alawo.


Ge nti olu ndi nāb͕alaga, ndi nāb͕apu n'ala Babilon, igosi ibọ̀-ọ́bọ̀ nke Jehova, bú Chineke-ayi, na Zaion, bú ibọ̀-ọ́bọ̀ nke ulo uku Ya.


N'ihi nka nurunu ndum-ọdu Jehova, nke Ọ duworo megide Babilon; na èchìchè-Ya nile nke O chèworo megide ala ndi Kaldea, si: N'ezie ha gādọkpupu ha, bú ndi ntà nke ìgwè ewu na aturu: n'ezie ọ gēju ebe-ita-nri-ha anya bayere ha.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan