Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Jeremaya 50:44 - Bible Nso

44 Le, dika ọdum ka ọ nārigo, bú nke si na nbili-elu nke Jọdan arigo, rue ebe-ita-nri nādigide mb͕e nile: ma n'otù ntabi-anya ka M'gēme ka ha si n'aru ya b͕a ọsọ; ma ònye bu onye arọputara? onye-nlekọta-ya ka M'gēme ya: n'ihi na ònye di kam? ọ̀ bu kwa onye gākaram mb͕e? ma-ọbu ònye bu kwa onye-ọzùzù-aturu a nke gēguzo n'irum?

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

44 Lee, dịka mgbe ọdụm na-esi nʼoke ọhịa Jọdan na-arịgopụta nʼebe ịta nri nke ụmụ anụmanụ jupụtara nʼahịhịa ndụ, nʼotu ntabi anya ka m ga-esi nʼala ya chụpụ Babilọn. Ma onye bụ onye ahụ a họpụtara, onye m ga-enyefe ọrụ a nʼaka? Onye dịka m? Onye kwa pụrụ ịpụta tụọ m aka nʼihu? Onye bụkwa onye ọzụzụ atụrụ ahụ nke pụrụ ido onwe ya megide m?”

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Jeremaya 50:44
18 Iomraidhean Croise  

N'ihi na ònye nime mbara-ígwé ka agēji turu Jehova? Ònye yiri Jehova n'etiti umu Chineke?


Jehova, Chineke nke usu nile nke ndi-agha, Ònye di ike dika Gi, Ja? Ikwesi-ntukwasi-obi-Gi di kwa Gi buruburu.


Ònye di ka Gi n'etiti chi nile, Jehova? Ònye di ka Gi, di ebube n'idi-nsọ? Onye anātu egwu n'otuto nile, nēme ihe-ebube di iche iche.


Ònye kwa ka unu gāsi na Chineke yiri ya? ma-ọbu ìhe-oyiyi gini ka unu gēdo n'usoro n'ebe Ọ nọ?


Ònye kwa ka unu gāsi na Mu yiri ya, M'we ra ka ya? ka Onye Nsọ nāsi.


Akpọtewom otù onye site n'Ugwu, o we bia, otù onye site n'ọwuwa-anyanwu nke gākpọku aham: ọ gābiakwasi kwa ndi nọchiri anya eze dika agāsi na ha bu urọ, na dika ọkpu-ite si azọ ájá.


Unu onwe-unu bu ndi-àmàm, ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta, na orùm nke M'rọputara: ka unu we mara, kwerem, ghọta na Mu onwem bu Onye ahu: ọ dighi chi ọzọ eburu Mu onwem uzọ kpu, ma ọ bu nke gēsom n'azu.


nēsi n'ọwuwa-anyanwu kpọ udele, nēsi kwa n'ala di anya kpọ onye gēme ndum-ọdum: e, ekwuwom, M'gēme kwa ka o me; ezubewom, M'gēme kwa ya.


Chetanu ihe mbu nile site na mb͕e ebighi-ebi gara aga: n'ihi na Mu onwem bu Chineke, ọ dighi kwa Chineke ọzọ di; abum Chineke, ọ dighi kwa otù efu di ka Mu onwem;


Chikọtanu onwe-unu, unu nile, nuru kwa; ònye n'etiti ha gosiworo ihe ndia? Onye ahu Jehova huworo n'anya gēme ihe nātọ Ya utọ na Babilon, ọ bu kwa ogwe-aka-ya gādakwasi ndi Kaldea.


Asi na i so ndi ji ukwu eje b͕a ọsọ, ha we me ka ike gwu gi, ì gēsi kwa aṅa nu ọku n'obi ib͕akari inyinya? ọ bu kwa n'ala udo ka i nọ na ntukwasi-obi, ma ì gēsi aṅa me na nbili-elu nke Jọdan?


Ọ rapuwo okwu-ọhia-Ya, dika ọdum: n'ihi na ala-ha aghọwo ihe-iju-anya site n'idi-ọku nke mma-agha nēme ihe-ike, na site n'iwe-Ya di ọku.


Ọzọ, onye-ebube nke Jekob gābu onye sitere na ya, onye nāchi ya gēsi kwa n'etiti ya puta; M'gēme kwa ka ọ biarue nso, o we biakutem nso: n'ihi na ònye ka onye a bu nke nọworo obi-ya mbé ibiakutem nso? ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta.


Kpọnu nkpu-agha megide ya buruburu; o kweyewo ekweye; ihe-nkwagide-ya nile adawo, etikpọwo kwa mb͕idi-ya nile: n'ihi na ibọ̀-ọ́bọ̀ Jehova ka ọ bu: bọ̀nu ya ọ́bọ̀; dika ọ meworo, menu ya otú a.


Ge nti, ọ bu olu nke ikwasi-ákwá-ike nke ndi-ọzùzù-aturu! n'ihi na emebiwo ebube-ha: ge nti, ọ bu olu ib͕ọ-uja nke umu-ọdum! n'ihi na emebiwo nbili-elu nke Jọdan.


o we gwa Kora, gwa kwa nzukọ-ya nile, okwu, si, N'ututu Jehova gēme ka amara ndi O nwere, na onye di nsọ, na onye Ọ gēme ka ọ biarue nso Ya: Onye Ọ gārọputa, onye ahu ka Ọ gēme kwa ka ọ biarue nso Ya.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan