Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Jeremaya 50:32 - Bible Nso

32 Onye-nganga gāsu kwa ngọngọ, da, ma ọ dighi onye ganēme ka o bilie: M'gēsuye kwa ọku n'obodo ya nile, o gēripia kwa ebe nile di ya buruburu.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

32 Onye nganga ahụ ga-asọ ngọngọ daa, ma o nweghị onye ga-enyere ya aka ka o bilitekwa. Aga m esunye obodo ya niile ọkụ, nke ga-erechapụ ndị niile gbara ya gburugburu.”

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Jeremaya 50:32
22 Iomraidhean Croise  

Ka ihere me ndi-nganga; n'ihi na ha ewerewo okwu-ugha me ka ikpém b͕agọ ab͕agọ: Ma m'gātughari uche n'ihe-iriba-ama-Gi nile.


N'iru ntipia ka npako nāga, Ọ bu kwa n'iru isu-ngọngọ ka idi-elu nke mọ madu nāga.


N'iru ntipia ka obi madu di elu, Ọ bu kwa n'iru nsọpuru ka obi ume-ala nāga.


M'gēwere kwa nmehie-unu leta unu dika nkpuru omume nile unu si di, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta): M'gēsuye kwa ọku n'oké ọhia-ya, ọ gērichapu kwa ihe nile di ya buruburu.


M'gēsuye kwa ọku na mb͕idi Damaskọs, ọ gēripia kwa ulo nile di elu nke Ben-hedad.


Ha agaghi-eweputa nime gi otù nkume ido na nkuku-ulo, ma-ọbu otù nkume itọ ntọ-ala; n'ihi na ebe nke tọb͕ọrọ n'efu mb͕e ebighi-ebi ka i gābu; ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta.


i gāsi kwa, Otú a ka Babilon gēmikpu, ghara ibili ọzọ n'ihi ihe ọjọ ahu nke Mu onwem gaje ime ka ọ biakwasi ya: ike ewe gwu ha. Rue ebe a bu okwu Jeremaia.


Ma mb͕e obi-ya di elu, mb͕e mọ-ya di kwa ike ime ihe-nganga, emere ka o si n'oche-eze nke ala-eze-ya ridata, ọ bu kwa ebube-ya ka ewezugara n'ebe ọ nọ:


ma M'gēzite ọku n'elu mb͕idi Taia, o gēripia kwa ulo-elu-ya nile.


ma M'gēzite ọku na Timan, o gēripia kwa ulo-elu nile nke Bọzra.


ma M'gēsuye ọku na mb͕idi Raba, ọ gēripia kwa ulo-elu-ya nile, n'iti-nkpu agha n'ubọchi agha, n'oké ifufe n'ubọchi oké ikuku:


ma M'gēzite ọku n'ulo Hazael, ọ gēripia kwa ulo-elu nile nke Ben-hedad.


ma M'gēzite ọku n'elu mb͕idi Geza, ọ gēripia kwa ulo-elu-ya nile:


ma M'gēzite ọku na Moab, o gēripia kwa ulo-elu nile nke Keriot; Moab gānwu kwa anwu na nkpọtu, na n'iti-nkpu agha, na n'olu opì-ike:


ma M'gēzite ọku na Juda, o gēripia kwa ulo-elu nile nke Jerusalem.


Nwa-ab͕ọghọ Israel nke nāmaghi nwoke adawo; ọ gaghi-ebili ọzọ: atusawo ya n'ala-ya; ọ dighi onye nēme ka o bilie.


N'ihi na amuyewo ọku n'iwem, Ọ nēre kwa rue ala-mọ nke dichasi ala, Ọ nēripia kwa uwa na ihe-ọmume-ya, Nēme kwa ka ntọ-ala nile nke ugwu nile nwuru ọku.


N'ihi nka ọ bu n'otù ubọchi ka ihe-otiti-ya nile gābia, bú ọnwu, na iru-újú, na unwu; agērechapu kwa ya n'ọku; n'ihi na Ọ di ike, bú Onye-nwe-ayi Chineke, Onye kpere ya ikpé.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan