Jeremaya 50:29 - Bible Nso29 Menu ka ndi-ọb͕a-uta nuru izukọ imegide Babilon, bú ndi nile nāzọ uta ukwu ikwe ya; manu ulo-ikwū-unu imegide ya buruburu; ya ghara inwe ndi b͕apuru ab͕apu: kwughachinu ya ugwọ dika ọlu-ya si di; dika ihe nile si di nke o meworo, menu ya otú a: n'ihi na Jehova ka o meworo nganga megide, megide Onye Nsọ nke Israel. Faic an caibideilBaịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a29 “Kpọkọtanụ ndị na-agba ụta maka imegide Babilọn, bụ ndị niile na-agba ụta. Maanụ ụlọ ikwu, gbaa ya gburugburu; unu ekwela ka onye ọbụla si nʼime ya gbapụ. Kwụghachi ya ụgwọ dịka ọrụ ya si dị, dịka ihe niile ahụ o mere si dị meenụ ya otu ahụ. Nʼihi na o buliela onwe ya elu megide Onyenwe anyị, bụ Onye nsọ nke Izrel. Faic an caibideil |
ma ọ bu imegide Onye-nwe elu-igwe ka i buliworo onwe-gi; ọ bu kwa aria nile nke ulo-Ya ka ha chitaworo n'iru gi, gi onwe-gi na ndi-isi-gi na ndi bu nwunye-gi na ndi-iko-gi nwanyi nāṅu kwa manya-vine nime ha; ọ bu kwa chi nile nke ọla-ọcha, na nke ọla-edo, na nke ọla, na nke ígwè, na nke osisi, na nke nkume, nke nādighi-ahu uzọ, nke nādighi-anu kwa ihe, nke nādighi-ama kwa ihe, ka i jaworo: ma Chineke ahu Onye ume-gi di n'aka-Ya, Onye nwe-kwa-ra uzọ-gi nile, ka i nāsọpurugh: