Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Jeremaya 50:27 - Bible Nso

27 Gbuenu oke-ehi-ya nile; ka ha rida ka ewe b͕ue ha: ahuhu diri ha! n'ihi na ubọchi-ha abiawo, bú mb͕e nleta-ha.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

27 Gbuonụ ụmụ oke ehi ya niile, ka ha niile gaa nʼebe ụlọ igbu anụ Ahụhụ na-adịrị ha, nʼihi na ụbọchị ahụ a kara aka banyere ha abịala, bụ oge a ga-eji taa ha ahụhụ.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Jeremaya 50:27
22 Iomraidhean Croise  

Ibobo bayere ubọchi-ya anwuwo ndi bi n'akuku Ọdida-anyanwu n'aru, Ndi bi n'akuku Iru-anyanwu atuwo kwa oké ujọ.


Ọtutu oke-ehi dim buruburu: Oke-ehi di ike nke Beshan ab͕awom buruburu.


Onye-nwe-ayi nāchì ya ọchì: N'ihi na Ọ huwo na ubọchi-ya nābia


Onye-nche siri, Ututu abiawo, ma abali abiawo kwa: ọ buru na unu gāju ase, juanu ase: laghachinu, bia.


Mma-agha Jehova juputara n'ọbara, emewo ka ọ ma abuba site n'abuba, site n'ọbara umu-aturu na nkpi, site n'abuba nke akuru ebulu: n'ihi na àjà di Jehova nwere na Bọzra, O nwe-kwa-ra oké ob͕ub͕u n'ala Edom.


Atu gēso kwa ha rida, umu-oke-ehi kwa, ha na oke-ehi; ala-ha gāṅuju kwa ọbara afọ, agēme kwa ka ájá-ha ma abuba site n'abuba.


Ma Gi onwe-gi maram, Jehova; I nāhum, nwa kwa nkpuru-obim n'ebe I nọ: dọkpupu ha dika ìgwè ewu na aturu agēb͕u eb͕u, do ha nsọ nye ubọchi ob͕ub͕u.


Kwasienu ákwá ike, unu ndi-ọzùzù-aturu, ti-kwa-nu nkpu; turu-kwa-nu na ntu, unu ndi di ebube n'etiti ìgwè ewu na aturu: n'ihi na ubọchi-unu eruzuwo ka eb͕ue unu, M'gākpasa kwa unu, unu gāda kwa dika ihe anāchọsi ike.


Mba nile gēfè kwa ya na nwa-ya na nwa nwa-ya òfùfè rue mb͕e mb͕e ala-ya biara: mb͕e ahu ya onwe-ya ka ọtutu mba na ndi-eze nke di uku gēme ka ọ fè ha òfùfè.


Ọzọ, ndi-ya egoro agha ndi nọ n'etiti ya di ka umu-ehi nke ulo ebe anēme ka anu ma abuba; n'ihi na ha onwe-ha elewo anya n'azu, ha ab͕alagawo n'otù, ha eguzogh: n'ihi na ubọchi nhuju-anya-ha abiakwasiwo ha, bú mb͕e nleta-ha.


Onye anābu ọnu ka onye nke ji aghughọ eje ozi Jehova bu, onye anābu ọnu ka onye nke nēb͕opu mma-agha-ya n'ọbara bu kwa.


Emebiwo Moab, obodo-ya nile akwugowo kwa n'anwuru-ọku umu-okorọbia-ya arọputara arọputa aridawo kwa n'ob͕ub͕u, ọ bu ihe si n'ọnu Eze ahu puta, Jehova nke usu nile nke ndi-agha bu aha-Ya.


Onye ahu nke nāb͕apu n'iru oké egwu ahu gādabà n'olùlù ahu; ọzọ, onye ahu nke nārigoputa n'òlùlù ahu, agējide ya n'ib͕udu ahu: n'ihi na M'gēme ka arọ nleta-ha biakute ya, bú Moab; ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta.


N'ihi na unu nāṅuri ọṅu, n'ihi na unu nāṅuri ọṅu-agha, unu ndi nāpunara ihe-nketam ihe, n'ihi na unu nāwuli elu dika nwa-ab͕ọghọ-ehi nke nāzọcha ọka, unu nēbe kwa dika inyinya di ike;


Le, Mu nēmegide gi, gi onye-nganga, (ọ bu ihe si n'ọnu Onye-nwe-ayi, bú Jehova nke usu nile nke ndi-agha, puta): n'ihi na ubọchi-gi abiawo, bú mb͕e M'gēleta gi.


M'gēme ka ha rida dika umu-aturu ka ewe b͕ue ha, dika ebulu, ha na nkpi.


Ha anuwo na onye nēze ume ka m'bu; ọ dighi onye-nkasi-obi m'nwere; Ndi-irom nile anuwo ihe ọjọm; obi atọwo ha utọ na Gi onwe-gi emewo ya: I gēme ka ọ bia, bú ubọchi I kpọsaworo, ha ewe di ka mu onwem.


ka ha nēguzo n'ebe di anya n'ihi egwu nke nmekpa-aru-ya, nāsi, Ahuhu, ahuhu, obodo uku ahu, Babilon, bú obodo ahu di ike! n'ihi na n'otù oge hour ka ikpé-gi biara.


M'we hu otù mọ-ozi ka ọ nēguzo nime anyanwu; o we were oké olu tie nkpu, nāsi nnunu nile nke nēfe n'etiti elu-igwe, Bianu, zukọ iri oké nri-anyasi nke Chineke;


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan