Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Jeremaya 50:24 - Bible Nso

24 Esiworom i ọnyà, ọzọ kwa, amawo gi n'ọnyà ahu, gi Babilon, ma gi onwe-gi amagh: achọtawo gi, ọzọ kwa, ejidewo gi, n'ihi na Jehova ka i lusoworo ọ̀gù.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

24 Esiiri m gị ọnya, gị Babilọn; ị makwara nʼọnya ahụ tupu ị mata na ọnya ahụ dị. A chọtala gị, jidekwa gị, nʼihi na i doola onwe gị ibuso Onyenwe anyị agha.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Jeremaya 50:24
17 Iomraidhean Croise  

N'ihi na o setipuwo aka-ya imegide Chineke, Ọ bu kwa imegide Onye Nke puru ime ihe nile ka ọ nēme onwe-ya onye di ike;


Onye nādọ aka na nti, ọ̀ nāluso Onye puru ime ihe nile ọ̀gù? Onye nābara Chineke nba, ya za ya.


Ma-ọbu ọ̀ bu ogwe-aka dika Chineke ka i nwere? Ọ̀ bu kwa olu dika Ya ka i gēji ma dika éb͕è-elu-igwe?


O nwere obi nke mara ihe, Ọ nāb͕a kwa ume n'ike: Ònye mere onwe-ya ka o sie ike imegide Ya, we nọ n'udo?


Moses na Eron we bakuru Fero, si ya, Otú a ka Jehova, bú Chineke nke ndi-Hibru, siri, Rùe ole mb͕e i gāju iweda onwe-gi n'ala n'irum? zipu ndim, ka ha we fèm.


N'ihi na ọbuná madu adighi-ama mb͕e-ya: dika azù nke anānwude n'ub͕u ọjọ, na dika umu nnunu nke nāma n'ọnyà, dika ndia ka umu madu nāma n'ọnyà na mb͕e ọjọ, mb͕e ọ nādakwasi ha na mberede.


M'gēwere kwa ihe ọjọ ya leta elu-uwa dum madu bi, were kwa ajọ omume-ha leta ndi nēmebi iwu; M'gēme kwa ka npako nke ndi-nganga kwusi, M'gēme kwa idi-elu nke ndi nēme ka madu ma jijiji ka ọ di ala.


Ahuhu gādiri onye nāluso Onye kpuworo ya ọ̀gù! otù ejùjù nile nke ala! Urọ, ọ̀ gāsi onye nākpu ya, Gini ka i nālu? ma-ọbu ọlu-gi, ọ̀ gasi, Ọ dighi aka abua o nwere?


Oké egwu na olùlù na ib͕udu nādikwasi gi, gi onye bi na Moab; ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta.


Onye ahu nke nāb͕apu n'iru oké egwu ahu gādabà n'olùlù ahu; ọzọ, onye ahu nke nārigoputa n'òlùlù ahu, agējide ya n'ib͕udu ahu: n'ihi na M'gēme ka arọ nleta-ha biakute ya, bú Moab; ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta.


M'gēme kwa ndi-isi-ya, na ndi-ya mara ihe, na ndi-ya nāchi ala, na ndi-ya nọchiri anya eze, na ndi-dike-ya, ka ha ṅubiga manya ókè; ha gāraru kwa ura ebighi-ebi, ghara iteta; ọ bu ihe si n'ọnu Eze ahu puta, Jehova nke usu nile nke ndi-agha bu aha-Ya.


Na mberede ka Babilon daworo, ewe tipia ya: kwasierenu ya ákwá ike; werenu balm bayere ihe-nb͕u-ya ma eleghi anya agāgwọta ya.


onye nēmegide nēweli kwa onwe-ya elu imegide ihe nile anākpọ Chineke ma-ọbu nke bu ihe anāsọpuru dika Chineke; ya mere ọ nānọdu n'ulo nsọ nke Chineke, nēgosi onwe-ya si na ya bu Chineke.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan