Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Jeremaya 50:21 - Bible Nso

21 Rigo megide ala Merataim, imegide ya, rigo kwa rue ndi bi na Pekod: b͕ue, wezuga kwa ka ebibie n'azu ha, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta), me kwa dika ihe nile si di nke M'nyeworo gi n'iwu.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

21 “Busonụ ala Merataim agha, busokwanụ ndị bi na Pekod agha. Chụọ ha ọsọ, gbuchapụ ma bibiekwa ha niile kpamkpam.” Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri. “Mezuonụ ihe niile m nyere unu nʼiwu.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Jeremaya 50:21
17 Iomraidhean Croise  

Devid we si Abishai, si kwa ndi-orù-ya nile, Le nwam, nke siri n'afọm puta, nāchọ ndum: onye Benjamin nka, ò gēsi kwa aṅa ghara ichọkari ya ub͕u a? ka ọ nọduru onwe-ya, ka ọ kọcha kwa; n'ihi na Jehova siworo ya, Kọcha.


Ub͕u a ọ̀ bu n'ejighi Jehova ka m'rigoro imegide ebe a ibibi ya?


Otú a ka Sairọs, bú eze Peasia, siri, Ala-eze nile nke uwa ka Jehova, bú Chineke elu-igwe, nyeworom; Ya onwe-ya me-kwa-ram ka m'buru onye-nlekọta n'iwuru Ya ulo nime Jerusalem, nke di na Juda. Ònye nọ n'etiti unu site na ndi-Ya nile? ka Jehova, bú Chineke-ya, nọyere ya, ya rigo kwa.


Imegide mba emeruru emeru ka M'nēziga ya, bayere ndi nke nrubiga-ókè-iwem ka M'nēnye kwa ya iwu, ikwata ihe-nkwata n'agha, na iluta ihe-nluta n'agha, na ido ha ihe-nzọtọ dika apiti nke èzí.


Onye ahu Nke nēkwu okwu bayere Sairọs, si, Ọ bu onye-ọzùzù-aturum, ihe nile nke nātọm utọ ka ọ gēmezu kwa: ọbuná n'ikwu okwu bayere Jerusalem, si, Agēwu ya; na n'isi ulo uku Chineke, Agātọ ntọ-ala-gi.


Chikọtanu onwe-unu, unu nile, nuru kwa; ònye n'etiti ha gosiworo ihe ndia? Onye ahu Jehova huworo n'anya gēme ihe nātọ Ya utọ na Babilon, ọ bu kwa ogwe-aka-ya gādakwasi ndi Kaldea.


Mu onwem, ọbuná Mu onwem, ekwuwo okwu; e, akpọwom ya: emewom ka ọ bia, ọ gēme kwa ka ije-ya ga nke-ọma.


Le, M'gaje inye iwu, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta), me ka ha biaghachi n'obodo a; ha gēbuso kwa ya agha, were ya, sure ya n'ọku: ọ bu kwa obodo nile nke Juda ka M'gēme ka ha ghọ ebe tọb͕ọrọ n'efu, ghara inwe onye-obibi.


Onye anābu ọnu ka onye nke ji aghughọ eje ozi Jehova bu, onye anābu ọnu ka onye nke nēb͕opu mma-agha-ya n'ọbara bu kwa.


Kpọnu nkpu-agha megide ya buruburu; o kweyewo ekweye; ihe-nkwagide-ya nile adawo, etikpọwo kwa mb͕idi-ya nile: n'ihi na ibọ̀-ọ́bọ̀ Jehova ka ọ bu: bọ̀nu ya ọ́bọ̀; dika ọ meworo, menu ya otú a.


N'ihi na otù mba esiwo n'Ugwu rigoputa imegide ya, mba ahu gēme ka ala-ya ghọ ebe tọb͕ọrọ n'efu, ọ dighi kwa onye ganēbi nime ya: ma madu ma anumanu, ha awaghariwo, la.


N'ihi na, le, Mu onwem gaje ikpọte me ka nkpọkọta mba uku di iche iche si n'ala Ugwu rigoputa imegide Babilon: ha gēdo kwa onwe-ha n'usoro megide ya; agēsi n'ebe ahu were ya: àkú nke usu ahu gādi ka nke dike nke bu ọ̀kà-uta; ọ gaghi-alaghachi azu n'efu.


bú umu Babilon na Kaldea nile, na Pekod na Shoa na Koa, ha na umu Asiria nile: bú umu-okorọbia anāchọsi ike, ndi nāchi ala na ndi nọchiri anya eze ka ha nile bu, ha bu ndi-isi-agha na ndi akpọrọ akpọ, ndi nānọkwasi n'inyinya ka ha nile bu.


Ebe-obibi-gi ka Chineke nke di site na mb͕e ochie bu, N'okpuru ka ogwe-aka mb͕e ebighi-ebi di kwa: Ọ chupu-kwa-ra onye-iro n'iru gi, We si, Kpochapu.


Ub͕u a je tib͕ue Amalek, wezuga ihe nile ọ bula o nwere ka ebibie ya, enwe-kwa-la ọmiko n'aru ya; kama me ka ha nwua, ma nwoke ma nwayi, ma nwatakiri ma nwa nāṅu ara, ma ehi ma aturu, ma camel ma inyinya-ibu.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan